Take a fresh look at your lifestyle.

Don Brymo Uchegbu: Ihe i kwesịrị ịma maka onye ejije Nollywood a lara mmụọ

0 242

Onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Don Uchegbu a ma dịka ‘Don Brymo’ anwụọla ka ọ gbachara afọ 56.

Uchegbu, nwụrụ n’ụtụtụ Tozde ka ọ rịachara ahụ nwa oge.

Odogwu ahụ e ji ime agwa eze maọbụ okenye Igbo n’ihe ejije daara ahụ dịka ọ nọ ebe ha na-eme ihe ejije na Pọtakọt, e buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ were nwụọ, dịka onyeisi otu jikorọ ndị ejije Nollywood bụ Emeka Rollas si gwa BBC Igbo.

Rollas gwara BBC Igbo na mkparịtaụka n’ekwentị na Don Brymo sị, “Maazị Don Brymo, onye na-eme ihe egwuregwu bụ onye nwụrụ n’ụtụtụ taa.”

“Dịka ndị ya na ya na-arụ ọrụ si gwaa m, ọ bịara ọrụ, ha hụ na ahụ adịchaghị ya ka ọ na-adị ya, ha gwara ya gaa ụlọọgwụ, mana ọ sịrị na ya aṅụọla ọgwụ na ya ga-arụli ọrụ ha bịara.”

“Ha malitere ọrụ rue mgbe ebe Elekere 6 nke mgbede bụ mgbe ọ laghachiri n’ụlọ ndịna mana ebe elekere 10 nke abalị ndị ọrụ ụlọ ndịna ahụ kpọrọ onye otu anyị gwa ya na ahụ adịghị Don Brymo mma.”

Ọ gbatara, e buru ya gawa ụlọọgwụ n’abalị ahụ. E mechaa ndị ezinaụlọ ya bịa buru ya buga n’ụlọọgwụ ọzọ.”

” Nwunye rutere taa, kpọọ ma kwuo na di ya ahapụla.”

Rollas , onye tụrụ arịrị na “ọnwụ ike Don Brymo tinyere ndị otu ha n’iru uju” kwuru n’akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na Brymo tụpọrọ ebe ọ na-eme ihe ejije bụ akụkọ ụgha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *