Take a fresh look at your lifestyle.

Usoro e ji ahọpụta ndị ndu ụlọomeiwu

0 282

A na-ahọpụta ndịisi ụlọomeiwu site na n’usoro ntuliaka a kpọrọ ‘indirect election’ nke ndị omeiwu na-eme n’etiti ha.

Ọtu onye ọnụ na-eru n’okwu n’ihe ndọrọ ndọrọ bụ Ugo Egbujo sị na ọ bụrụ e duchaa ndị omeiwu n’iyi ọrụ, na ha ga-amalite ịhọpụta ndị ndu site n’ihiwe ọgbakọ a kpọrọ ‘quorum’ bụ ọnụọgụgụ ndị ụlọomeiwu kachasị nta iji mee nzukọ ha.

O kwuru na onye na-ahazi ntuliaka ndị omeiwu a bụ onye a na-akpọ ‘clerk’ ndị omeiwu.

“Ọ bụ opekatampe otu ọkara n’ime ụzọ atọ e kere ndị ụlọomeiwu nwereike ihiwe ọgbakọ iji họpụta ndị ndu ha.”

“Ngwa ngwa e mere nke, a ga-enye ohere ka ndị mmadụ kpọpụta aha ndị ha chọrọ ka a tụọrọ vootu.

“A malitezie ịtụ vootu, onye ọbụla nwere ọnụọgụgụ vootu kachasị ka a ga-akpọpụta dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu na nke nta.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ pati ọnụọgụgụ ha kachasị n’ụlọomeiwu ga-enwe ohere ịhọpụta ndị ga-abụ ndị ndu n’ụlọomeiwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *