Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ụlọomeiwu ukwu na nke nta Naịjirịa emechaala ntuliaka ha.

0 385

Ndị ụlọomeiwu Naịjirịa bu ụzọ mechapụ ntuliaka nke ha dịka ndị ụlọomeiwu nta gara n’ihu na-eme nke ha.

Ntuliaka ahụ họpụtara Godswill Akpabio dịka onye ga-achị ụlọomeiwu Naịjirịa agba ọchịchị nke iri ebe a họpụtara Tadujeen Abbas dịka onye ga-achị ụlọomeiwu nta Naịjirịa.

Ọnụọgụgụ vootu a tụrụ Akpabio kacha ebe o nwetere vootu iri isii na ato ebe onye so ya n’azụ bụ Abdul’aziz Abubakar Yari nwetere vootu 46.

Akpabio na onye osote bụ Barau Jibrin ga-anọzị n’isi ọchịchị ụlọomeiwu Naịjirịa ugbua.

Abbas ji vootu 353 merie dịka nchịkọta vootu niile a tụrụ bụ 359.

A họpụtakwara Ben Kalu dịka osote onyeisi ụlọọmeiwu nta Naịjirịa. Enweghi onye mere ya aka n’atụmatụ ahụ.

Cheta na otu All Progressives Congress (APC) bụ pati ha wepụtara aha mmadụ abụọ a nwetere mmeri dịka ndị ha chọrọ ka ha chịa ọkwa ndị a nke onyeisiala Bola Tinubu kwadoro n’oge ahụ.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *