Take a fresh look at your lifestyle.

Ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ Hadi Sirika kwuru maka Nigeria Air na ihe ndị ọzọ

0 260

Onye bụbu minista njem ụgbọelu Naịjirịa ekpugheela na ọ bụ naanị ijeri Naịra atọ ka gọọmentị etiti wetere maka atụmụta ọrụ Nigeria Air.

Nigeria Air bụ ụlọọrụ ụgbọelu nke Naịjirịa nke e hibere ịrụ ọrụ ibu ndị njem aga mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

Na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Arise TV, o kwuru na mgbe ọ na-apụ n’ọkwa ahụ na oge gọọmentị wepụtara maka atụmatụ ụlọọrụ Nigeria Air ka fọrọ.

Ọ kọwara, etu e siri hazie ụlọọrụ ahụ bụ:

“Pasentị ise bụ maka gọọmentị etiti bụ nke ministri ego na-echekwa, pasentị 49 bụ nke ha na ụlọọrụ Ethiopian Airline na-eketa, pasentị 31 bụ maka MRS ebe pasentị 15 bụ nke SAHCO”

Cheta na mkpughe ụlọọrụ kpatara ọtụtụ okwu dịka aka chịburu Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ya mechie ọrụ ya.

Ụfọdụ ihe ndị ọzọ o kwuru

  • Na ndị nwee ụlọọrụ ahụ bụ ndị ji mkpughe ya mee ozi azụmahịa ma kpọ ya oku ka ọ bịa nyocha ọrụ ahụ dika ọ mara ọkwa na ụlọọrụ ahụ ga-amalite ọrụ n’uju ma hazichaa okwu AOC
  • Na e nweghi ego gọọmentị wetere maka mbata ụgbọelu ndị ahụ a ji mee mkpughe ụlọọrụ ahụ
  • Na gọọmentị achọghịzịdị itinye aka n’ọrụ ụlọọrụ ụgbọelu Nigeria Air , ma kwuo na ndị ọzọ aka ha nọ na ya nwereike ịga n’ihu na-elekọta ya bụ ụlọọrụ dịka ọ bụ naanị pasentị ise bụ oke gọọmentị na ya bụ ụlọọrụ
  • Na gọọmentị kwesiburu iweta ego ruru nde $350 maka ọrụ ụlọọrụ mana ihe mechara gbanwee
  • Na ọ bụ ihe ruru ijeri Naịra atọ ka ewepụtara maka ọrụ ụlọọrụ mana ego ahụ ka fọrọ
  • Na akụkọ na ihe niile gbasara ụlọorụ Nigeria Air zoro ezu dịka o kwuru na a kpọrọ ndị chọrọ itinye aka na ya bụ ụlọọrụ oku ka ha bịa weta ihe ha nwereike ya ma kere oke ha ma e mechaa
  • Iji saa okwu omeiwu Nnoli Nnaji nke sị na ihe gbasara ụlọọrụ Nigeria Air dịka ‘ihe nrụrụ aka”, o kwuru na ka o doo ọha anya na kọmitii nakwa ụlọomeiwu etinyeghi aka na mmepe ụlọọrụ Nigeria Air e mere.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *