Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka mmadụ ikwu okwu nwereike ibute nkewa

0 260

N’ọdịnso a, e nweela nrụrịtaụka na soshal midia gbasara okwu nke ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị welitere isi kwuru nke ọtụtụ kwuru na o nwereike ịkalite nkewa nakwa akpọmasị na Naịjirịa.

Okwu ndị a gụnyere okwu Nasir El-Rufai kwuru gbasara atụmatụ ndị okpukperchi Islam iweghara ọchịchị na Naịjirịa, nakwa ihe onyeisi ụlọ omeiwu Legọs bụ Mudashiru Obasa kwuru gbasara ime iwu ga-abara ndị Yoruba karịa ndị ọzọ.

Ọtụtụ kwuru ka e jide ndị ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ, nyochaa ha, ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ikwu okwu nwere ike ibute nkewa, mana ọtụtụ ndị ọzọ kwuru na iwu Naịjirịa nyere onye ọbụla ikike ikwu uche ya.

Iji tụlee okwu a ndi ntaa akuko Igbo kpọtụụrụ onye ọkaiwu aha ya bụ Chidi Ikeotuonye.

Gbasara ihe El-Rufai kwuru, Ikeotuonye kọwara na ọ bụ eziokwu na okwu ahụ gosiri echiche onye họọrọ okpukperechi ya karịa ịdịnotu Naịjirịa, mana “El-Rufai adaghị iwu ọbụla”.

“Ọ bụ uche ya ka o kwupụtara, ọ dịịrị ndị okpukperechi Christ ka ha saa ya ihe o kwuru. Onweghị mgbe o ji sị na ndị okpukperechi Vhrist bụ ndị arụ, maọbụ kparịa ha, maọbụ kpọọ ha iyi.”

N’aka nke ọzọ, gbasara ihe Obasa kwuru, Ikeotuonye kwuru na onweghị iwu ọbụla e mere iji kwalite otu agbụrụ ma butuo ndị ọzọ nke ga-akwụdo.

“Iwu Naịjirịa megidere ịmekpa mmadụ ahụ n’ụzọ ọbụla, maọbụ nye mmadụ ihe nrite n’ụzọ ọbụla naanị n’ihi agbụrụ maọbụ okpukperechi ya.” Ikeotuonye kọwara.

“Iwu nyere nwaafọ Naịjirịa ọbụla ikike ibi na mpaghara Naịjirịa ọbụla ọbụla masịrị ya, na-arụ ọrụ ebe ahụ, nwee akụnụba ahụ, rụọ ụlọ maọbụ zụọ ala ebe ọbụla ọmasịrị ha.”

“Ọ bụrụgodi na ndị omeiwu Legọs emee iwu iji nye ndị mpaghara Yoruba ohere ọbụla karịa agbụrụ ndị ọzọ, ụlọikpe ga-akụchapụ iwu dị otu a maka na ọ dabaghị n’iwu Naịjirịa.”

Ikeotuonye kọwara na ma El-Rufai, ma Obasa adabeghị iwu ọbụla nke e nwereike iji kpụpụ ha ụlọikpe, mana okwu ha egosila na ha amaghị iwu Naịjirịa nke ọma.

O kwukwara na ndị nọ n’ọkwa ọchịchị kwesịrị ị na-echezi echiche nke ọma tupu ha ekwuo ihe ọbụla, maka na okwu ha nwereike ịkwalite udo maọbụ bute ọgbaaghara n’obodo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *