Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe m gaara eme gbasara iwepụ ego ‘fuel subsidy’ – Peter Obi

0 415

Onye zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘Labour Party’ bụ Peter Obi ekwuola ihe ọ gaara ime ma ọ bụrụ na ọ bụ ya bụ onyeisiala Naịjirịa, gbasara mwepụ ego gọọmentị na-akwụ iji butuo ọnụahịa mmanụ ụgbọala, a na-akpọ ‘fuel subsidy’ na bekee.

Obi kwuru na ya gaara ebu ụzọ tinye atụmatụ dị icheiche iji belata ahụhụ ndị mmadụ ga-ata n’ihi mgbali elu ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

“Ọ bụrụ na i na-eso m nke ọma, malite n’oge m so na ndị ndụmọdụ nye onyeisiala (Goodluck) Jonathan, ekwuola m ugboro ugboro na ‘subsidy’ bụ ohi ka ọtụtụ ndị mmadụ ji ya ezu. Ekwukwara m na m ga-akwụsị ya,” Obi kwuru.

“Ọbụladị mgbe m na-achụ nta vootu, ekwukwara m na m ga-akwụsị ịkwụ ụgwọ subsidy.”

“Mana e kwenyere m na e kwesịrị ịkwụsị ‘subsidy’, mana gọọmentị kwesịrị itinye ihe dị icheiche ga-ebelata ahụhụ ndị mmadụ, ma kọwaara ha kpọmkwem ihe a ga-eji ego si na ya mee.”

Ọbụladị oge onyeisiala Jonathan kwụsịrị ‘subsidy’, ọ bụ oge ahụ ka e wepụtara atụmatụ ‘Sure-P’ na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.”

“Oge m bụ Gọvanọ Anambara Steeti, emere m ụfọdụ ihe yitere nke a, ya bụ ịkwụsị ụfọdụ ihe iji mepụta ihe ndị ọzọ, mana a ga-eme ya n’ụzọ ga-edo ndị mmadụ anya.

Ọ bụrụ na gọọmentị na-agwa ndị mmadụ ka ha nwee ndidi na-ata ahụhụ, o kwesịrị ka ndị mmadụ ghọta kpọmkwem uru ahụhụ ha na-ata ga-abara ha n’ọdịnihu.”

Chetakwa na Atiku Abubakar, onye zọrọ ọkwa onyeisiala na otu ‘Peoples Democratic Party’ kwukwara na ọ bụrụ ya bụ onyeisiala, ọ karaghị akwụsị ịkwụ ‘subsidy’ n’otu ntabi anya, kama ọ gaara ebu ụzọ nwee mkparịtaụka ya na ndị ọrụ nakwa ndị ọzọ iji mata usoro a ga-eji mee ya ka ọ ghara ibute nnukwu ihe isi ike n’obodo.

N’ụbọchị e duru ya n’iyi ọrụ, Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwuru na “Ịkwụ ụgwọ subsidy akwụsịla”, nke a mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa elu n’otu ntabi anya, mekwaa ka ọnụahịa ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbalie.

N’ihi nke a, otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ ‘Nigeria Labour Congress’ na ‘Trade Union Congress’ kwuru na ha ga-agba abụbụọrụ, mana gọọmentị gara ụlọikpe ma nata ikike iji gbochie abụbụọrụ a.

Ka ọ dị ugbua, gọọmentị etiti na ndị NLC na TUC na-enwe ọgbakọ iji mara etu a ga-esi belata ihe nhịahụ nke ndị ọrụ na-agabiga ugbua.

Gọọmentị kwuru na ha dị njikere ibuli ụgwọọnwa ndị ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *