Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Rotimi Akeredolu ka dị ndụ – Gọọmentị Ondo Steeti

0 257

Gọvanọ Ondo Steeti Rotimi akatọọla akụkọ kwuru na ọ nwụọla site n’ozi kọmishọna mgbasaozi ya bụ Bamidele Ademola-Olateju wepụtara.

Ọ gwara ọha ndị steeti ya ka ha gbaa akụkọ ụgha ahụ nkịtị.

Akụkọ na-ekwu na ahụ esichaghị gọvanọ ike, ugbua ọ nọghị na steeti ebe o nyefeghi osote ya bụ Lucky Aiyedatiwa ikike ọkwa.

Mana kọmishọna kwuru na Akeredolu na-arụ ọrụ dịịrị ya dịka onyeisi steeti ha ma na-emekwa ya ọfụma.

O kwetere n’ezie na gọvanọ anọghị nso ugbua.

N’okwu ya “anyị anụla kepukepu na-ekwu maka ọnọdụ ahụike gọvanọ, anyị gbara ya nkịtị ruo ugbua ndị obi ọjọọ chọrọ iji akụkọ ụgha mee ndọrọ ndọrọ.

“N’ezie gọvanọ anọghị nso ugbua mana ọ na-arụ ọrụ dịịrị ya dịka gọvanọ mgbe ọbụla ọ dapụtara.

“Anyị na-asị ka onye ọbụla gbaa nkịtị n’akwụkwọ ụgha na-efegharị na-ekwu na ọ nwụọla.”

Cheta ba pati Peoples Demcoratic Party (PDP) nke Ondo steeti gwara gọvanọ Akeredolu ka ọ rituo n’ọkwa ma ọ bụrụ na ike ọrụ agwụla ya.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru pati ahụ bụ Kennedy Peretei wepụtara, ma sị ka ha ejikwala ahụike Akeredolu azọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *