Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka n’Abuja nụrụ ikpe mkpesa PDP maka ntuliaka 2023.
Ndị ọkaiwyu nọchịchị ndị ikpe a metụtara gbakọrọ n’oge, n’ebe elekere atọ nke ehihe Tọọzde a bụ abalị mbụ nke ọnwa Juun, 2023.
Ndị ọkaiwu a gụnyere:
- Chris Uche. SAN (PDP)
- Kemi Pinheiro. SAN (INEC)
- Chief. Akin Olujimi. SAN (Bola Ahmed Tinubu)
- L.O Fagbemi (APC)
- Chris Uche. SAN (Labour Party)
PDP kpọpụtara ndị akaebe mmadụ atọ iji mee mkpesa maka okwu ebubo nrụrụaka ha sị mere n’oge ntuliaka 2023.
Ụlọikpe nabatara akaebe nke mbụ kwuru na o si Kogi steeti ma bụrụ onye rụrụ ọrụ dịka onye nnọchịteanya PDP n’oge ntuliaka ahụ.
Onye ọkaiwu Inec bụ Abdullahi Aliyu weere ọrụ inyocha ya ka a mara na ihe o na-ekwu abụ eziokwu.
Onye akaebe ahụ gara n’ihu kwuo okwu n’aha pati ahụ ma kọwa na n’oge ntuliaka ọ gagharịrị na ọgbọ ntuliaka karịrị 20 n’okpuruọchịchi Olamaboro nakwa Lokoja nke Kogi steeti ma nọrọ lee anya n’aha pati ya ihe dịka nkeji atọ ruo ise.
O kwuru na ọ na ndị ọrụ Inec manyere ụfọdụ ndị ndị nnọchite pati ha ka ha binyeaka n’akwụkwọ ndị eji tụọ vootu nke e digharịrịla ụfọdụ ozi n’ime ya ma mee nrụrụaka.
Onye akaebe nke abụọ wepụtakwara mkpesa ya mana ọkaiwu APC rụrụ onye abụọ aka ma kwuo na okwu ọnụ ya yiri ihe onye akaebe nke mbụ kwuru kpọm kwem nke mere ha jiri na-enyo okwu ọnụ ya enyo.
O zọrọ isi onwe ya site n’ikwu na nke a nwereike idi ire n’ihe ha abụọ nwere mkparịtaụka banyere ihe mere ụbọchị ahụ tupu ikpe ahụ amalite.
Ndị ọkaikpe nụchara mkpesa ha ma yigahria ikpe ahụ gaa ụbọchị Fraịdee abalị abụọ nke ọnwa Juun.
PDP ga-akpọpụta ndị akaebe nakwa ihe akaebe make mkpesa.
Cheta na n’ọnwa Febrụwarị mgbe Inec kpọpụtara Bola Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa ma nyekwa ya asambodo mmeri, Atiku Abubakar, PDP, Peter Obi, Labour Party nakwa mmadụ abụọ ọzọ – Solomon Okangbuan nke pati Action Alliance (AA), Nnadi Charles Osita nke ‘Action Peoples Party (APP), na Chichi Ojei nke pati Allied Peoples Movement (APM) – kwuru na ha ekwenyeghị na mkpọpụta ahụ Inec mere.
Ha na-ekwu na usoro ntuliaka ahụ ezighi ezi ma na-ebo ebubo nrụrụaka.
Leave a Reply