E wepụrụ ọkọlọtọ ọrụ nchekwa bu aha ya ma tinye nke ọhụrụ iji gosi malaite ọchịchị Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu.
Buhari chịrị Naịjirịa malite n’afọ 2015 ruo 2023.
Buhari chiburu Naịjirịa n’afọ 1983 ruo 1985 n’oge ọchịchị ndịgha Naijirịa.
N’oge mbata ọchịchị Buhari n’okpuru onye kwuo uche ya, ọ kwere ụmụafọ Naịjirịa ọtụtụ nkwa mana atọ n’ime ha gbara ezigbo ọkpụkpụrụ
Nke mbụ: Iweghachite ezi nchekwa, nke abụọ ịkwalite akụnụba Naịjirịa nke atọ ibuso nrụrụaka agha.
Ọ gbachitere ọrụ ya n’ozi ikpeazụ o zipụtara ụmafọ Naịjirịa mana ọtụtụ rụrụ ya aka na o metachaghị ihe ọkachasị n’okwu nkwa ndị o kwere.
Ọpụpụ Buhari bịara dị ka agba ikpeazụ ndị ọchịagha nke ndị mba Briten nyere ọzụzụ ga-achị Naịjirịa.
Leave a Reply