Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Omeiwu Uganda Kwadoro ọmụgwọ Nke Ezumike Nna.

Chigo dere ya n'igbo.

0 439

Ndị omeiwu Uganda ewepụtala akwụkwọ iwu na-abawanye ezumike nna site na anọ ruo ụbọchị asaa iji mee ka ndị nwoke na-arụ ọrụ na-enyere Nwunye ha aka oge ọmụgwọ.

Flavia Kabahenda, onye isi oche kọmitii okike nke nzuko omeiwu, kwuru, “Ọ dị mkpa ka enyekwuo oge maka ndị ọrụ nwoke ka ha nyere Nwunye ha aka,”

Ndị omeiwu ahụ kwuru na ha gbaziri akwụkwọ sitere na agbataobi Kenya nke na-enye ndị nwoke na-arụ ọrụ izu abụọ maka ezumike nna, ka akụkọ kwuru.

Otú ọ dị, nzuko omeiwu jụrụ atụmatụ inyekwu ụbọchị ezumike site na ụbọchị 60 dị ugbu a ruo ụbọchị 90 maka ndị ọrụ nwanyị na-amụ ihe karịrị otu nwa n’otu oge.

.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *