Take a fresh look at your lifestyle.

NNPC ga-enye ụlọ ọrụ Dangote na-edozi mmanụ agbadi ihe ruru ite mmanu 300,000 kwa ụbọchị.

Hauwa Abubakar Anaja dere ya na bekee.

0 197

NNPC ga-enye ụlọ ọrụ Dangote na-edozi mmanụ agbadi ihe ruru ite mmanu 300,000 kwa ụbọchị.

NNPC ga-ebunye ụlọ ọrụ Dangote ite mmanụ  ruru  300,000 kwa ụbọchị, ka ọ ga-amalite ọrụ n’izu na-abịa.

Onye isi ndị isi otu, NNPCL, Mele Kyari, mere nkwupụta a na Tọzdee n’emumme 4th Nigerian Oil and Gas Opportunity Fair na Yenagoa,  Steeti Bayelsa .

Ọ gwara ndị niile metụtara ka ha sonye na ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmanụ ala n’ịkwalite ngalaba mmanụ na gaasi na Naịjirịa.

O kwuru na NNPCL, nke nwere oke pasentị iri abụọ na ụlọ ọrụ a na-akwacha mmanụ, adịla njikere ịrụzu ọrụ inye mmanụ n’ụlọ ọrụ ahụ

Ụlọ nrụpụta Dangote, nke onye ọkacha nwee ego na Afrịka, Aliko Dangote, hibere, bụ nke a na-eme mmepe na Mee 22, 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *