Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ ikpe Mkpesa ntuli aka Onyeisiala ga-amalitekwa ikpe ikpe na Wednesde

0 261

Ụlọikpe mkpesa nke Presidential Election (PEPC) ga-amaliteghachi taa n’ụbọchị Wenezde n’Abuja, isi obodo Naijiria, ka ọ gaa n’ihu n’akwụkwọ mkpesa nke ndị Labour Party na-azọ ọkwa onyeisiala, bụ Mazị Peter Obi. Obi na-ama okwu ndị Independent National Electoral Commission (INEC) kwupụtara ọkwa onyeisiala Ahmed Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala n’afọ 2023.                                                                                                      GỤỌ KWESỊRỊ: Ụlọikpe nhọpụta: Ụlọikpe akwụsịla arịrịọ Obi tupu ọ malite ikpe n’abali iri na asa nke onwa Mee.                                                           N’ụbọchị ikpeazụ e yigharịrị tupu a nụ ya bụ Mee abali iri, Ndụmọdụ Peter Obi, Dọkịnta Livy Uzoukwu SAN, gwara ụlọikpe mkpesa na ya kwenyere na ndụmọdụ niile nyere ndị nke mbụ na nke anọ zara ajụjụ na a ga-eyigharị tupu ikpe ahụ ruo Wenezde abali iri na asaa. iji kwe ka agbanwere usoro niile pụtara ìhè ma jee ozi maka ịnụ ihe.                                                                                                                                                                                                   Ndụmọdụ nye INEC, Abubakar Mahmood SAN; Woke Olanipekum SAN maka Tinubu na Shetima; na Lateef Fagbemi nke All Progressives Congress (APC) kwadoro ụlọikpe nkwekọrịta ha niile maka mgbanwe azịza dị mkpa iji dịrị njikere maka nnabata n’ime ụbọchị ikpe ikpe na-abịa.                          Onyeisi ọkaikpe nke ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka onye isi ala, Justice Haruna Tsamani, ka ọ na-eyigharịrị ụbọchị iri na asa nke onwa Mee,eduzila ndị ndụmọdụ niile ka ha hụ na ha doziri okwu ndị a ga-ekpebi tupu ụbọchị ikpe na-abịa.                                                                                                               Ka ọ dị ugbu a, a ga-anụ akwụkwọ mkpesa nke ndị People’s Democratic Party’s (PDP) na-azọ ọkwa onyeisiala, Atiku Abubakar, n’abali iri na asato Tọzdee, onwa Mee, 2023.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *