Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe iwu Naịjirịa kwuru maka ima onye uweojii ụra

0 250

Onyonyo gosiri ebubo na onye otiegwu a ma ama bụ Seun Kuti mara onye uweojii Naịjirịa aka ntị pụtara na soshal midia n’izu gara aga n’akụkụ Legọs steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Steeti ahụ bụ Benjamin Hundeyin kwuru n’ụbọchị Mọnde, abalị iri na ise nke ọnwa Mee, 2023 na aka ha akparala ya bụ otiegwu bụ onye e boro ebubo iti onye uweojii ihe.

Hundeyin kwuru na Seun Kuti ji aka ya bịa n’ụlọọrụ ha n’ụtụtụ Mọnde a.

Cheta na onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba, nyeburu iwu n’izu gara aga ka e jide Mazị Kuti dịka onyonyo ahụ pụtara na soshal midia.

Ọ bụ ihe megidere iwu na Naịjirịa ịkpaso onye ọrụ nchekwa ọbụla agwa ọjọọ, dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa si kwuo.

Mana kedụ ihe ndị ọzọ iwu Naịjirịa kwuru banyere ihe dị etu a?

Cheta n’ebe afọ 2022, otu ihe onyonyo fesakwara na soshal mida nke gosiri ebe mmadụ abụọ na ndị uweojii abụọ nọ na-enwe esemokwu. Ndị nkiti abụọ a malitere zọsawa otu n’ime ndị uweojii ahụ egbe AK47 ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijịrịa bụ Muyiwa Adejobi kọwara mgbe ahụ na agwa a megidere iwu Naịjirịa ma kwuo na ọ bụrụgodi na onye uweojii ahụ enyeghi uwe ndị uweojii ya, na ya bụ onye nkiti enweghi ikike ịkpa ụdịrị agwa ahụ.

N’oge ahụ, Hundeyin kwuru na akụkụ iwu Naịjirịa nke 365 gosiri na ịmekpa onye uweojii ahụ bụ ezighbo ihe dara iwu nke nwereike ime ka mmadụ gaa nga afọ atọ.

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n’ime ya, họrọ ‘nabata na gaa n’ihu’.

Akụkụ iwu 356 (2) kwuru hoo haa: “Ịmakpa onye uweojii ahụ, ịjụ iso iwu onye uweojii nyere, ịma ụma gbochie onye uweojii ịrụ ọrụ ya, inyere onye na-eme nke aka megidere iwu.”

Adejobi kwukwara: ‘Nke a abụghị okwu ihe onye uweojii ahụ mere kama ọ bụ okwu agwaa ndị nkiti ahụ kpara nke bụ agwa mmekpa ahụ nye onye uweojii.”

Mgbe ihe onyonyo Kuti malitere ifesa, o ji soshal midia ya kwuo na o nwere ihe ịgba ama na onye uweojii ahụ nwara igbu ya na ezinaụlọ ya.

Ozi ya kwuru: “Ọ nwara igbu mụ na ezinaụlọ”

“E kpebiela m ịghara ibupụ okwu a ụlọikpe”

‘Unu tinyenụ ọnụ unu na-agba ma hapụ okwu tupu a napụ nwaamadị ọrụ ya.”

Okwu Kuti mere ọtụtụ ji malite ịjụ ‘Kedụ ihe mmadụ nwereike ime ma onye uweojii mekpa ya ahụ?’

Otu ọkaiwu nwere agba na Naịjirịa bụ Femi Falana nke bụkwa onye na-alụ ọgụ ikike diri onye ndị mmadụ kwuburu n’ozi o zipụtara n’oge gara aga.

“Ọ bụrụgodị na onye uweojii nye uwe ya maa onye nkiti ụra, onye nkiti ahụ enweghi ikike imagwara ya”

Ọ gbakwara ama n’oge ahụ na agwa dị etu a nwereike ime ka onye nkiti ọbụla gaa nga afọ atọ.

Ọ gara n’ihu kwukwaa na ndị uweojii kwesịrị ị na-akwanyere ndị nkiti ugwu dịịrị ha.

Ọ gara n’ihu kwuru na ikike ugwu dịrị mmadụ sokwa na ihe iwu Naịjirịa nke akụkụ iri ato na ano chekwara.

Falana kwukwara na akụkụ iwu ‘Anti-Torture Act’ nke afo 2017 bụ iwu megidere mmekpa ahụ kwuru na ịmekpa ndị nkiti ahụ nwereike ime mmadụ agaa nga afọ iri abuo na ise.

Ọ gara n’ihu kwuo n’akụkụ owu ‘Administrators of Criminal Justice Act, 2015’ naklwa ‘Police Establishment Act 2020’ emegidela imekpa ụmụafọ Naịjirịa ahụ gụnyere ndị a na-enyo enyo n’okwu ọbụla.

“Akụkụ iwu (2)(b) nke ‘Anti Torture Act’, 2017 kwuru na imekpa mmadụ ahụ gụnyere ịma ụma mee ka ahụ fụọ mmadụ ụfụ, maọbụ ịta mmadụ ahụhụ site n’ihe e mere ya n’ahụ maọbụ n’ihe metụtara ahụike ụbụrụ isi ya bụ ụzọ iji taa mmadụ ahụhụ maka ihe a sị o mere maọbụ ihe a sị onye ọzọ mere. Ime nke a nye onye nkiti nwereike ime onye mere ya agaa nga afọ iri abuo na ise dịka iwu ‘Anti Torture Act 2017’ siri kwuo”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *