Ndị mba Turkey na-esonye na ntuliaka ugbua iji kpebie ma Recep Tayyip Erdogan ọ ga-aga n’ihu ịbụ onyeisiala mba ahụ kamgbe afọ iri abuo ọ malitere ọchịchị ya.
Onye ya na Erdogan na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Kemal Kilicdaroglu ekwela nkwa ịkụchapụ ọtụtụ ike Erdogan nyere onwe ya kamgbe afọ 2016 dịka ụfọdụ gbara mbọ ịchutu ya n’ọkwa.
Ụfọdụ ndị ọkachamara n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na Kilicdaroglu nwereike inweta imeri.
Ihe abụọ bụ okwu a kpụ n’ọnụ dịka ntuliaka a na-amalite bụ mgbalị ọnụahịa ọtụtụ ihe nakwa ala ọma jijiji abụọ mere na mba ahụ nke gburu puku kwuru puku ndị mmadụ.
Ndị mmadụ amalitelarị ịkwụ n’ahịrị ọtụtụ awa tupu ntuliaka ahụ amalite dịka ọtụtụ kwuru na ha nwere olileanya ịnabata ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ha.
N’Antakya, nke bụ ebe ala ọma jijiji ahụ kacha metụta n’ọnwa Febrụwarị, ụgbọala bụs karịrị 100 si n’ụlọ nchereoge ebe ndị ala ọma jijiji bi bute ha n’ebe a na-eme ntuliaka ka ha wee tụọ vootu.
Iji nweta mmeri, otu onye n’ime Erdogan na Kilicdaroglu kwesịrị inweta ihe karịrị pasentị 50 nke vootu niile a tụrụ, ma ọ bụghị ya, a ga-enwe agba nke abụọ nke ntuliaka ahụ n’ime izuụka abụọ.
Leave a Reply