Take a fresh look at your lifestyle.

DA: kpọrọ oku ka  akagbuo ntuli aka onye isi ala 2023.

Salihu Ali, Abuja dere ya na bekee.

0 236

Democratic Alternative Party kpọrọ oku ka  akagbuo ntuli aka onye isi ala 2023.

N’ime ụbọchị ole na ole ka a ga-ewebata ọchịchị ọhụrụ na Naịjirịa, otu ndọrọndọrọ ọchịchị a na-akpọ Democratic Alternative DA akpọkuola onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ kagbuo ntuliaka onyeisiala n’afọ 2023 ma hazie nke ọhụrụ.

Otu ahụ kwuru na ezighi ezi nke Independent National Electoral INEC Commission INEC wepụrụ ya isonye na ntuliaka ahụ.

Na mkparịta ụka ndị nta akụkọ na Abuja, isi obodo Naijiria, onye na-azọ ọkwa onyeisiala nke Democratic Alternative DA Mr. Victor Okechukwu Vishnay kwukwara na, aha ya na akara pati ya  bu nke ewebatagh na ntuli aka 2023 n’agbanyeghị na ha sonyere  na ntuli aka 2019.

“Dịka onye ndoro-ndoro ochichi  maka onye isi ala Democratic Alternative na dị ka nwa amaala obodo Naijiria, anyị niile hụrụ obodo a n’anya ma taa ana m arịọ onye Naijiria ọ bụla nwere ezi uche nke agbụrụ ọ bụla na okpukperechi ka ọ sonyere m n’ịkpọ onye isi ala Muhammadu Buhari ka ọ bịa. Kagbuo ntuli aka nke 2023 gara aga ka eme e ntuliaka ọzọ, “Vishnay kwuru.

Ọ gbakwụnyere na “ọgụ a, anyị anaghị ebu ngwa ọgụ mana onye ọ bụla ga-anọdụ ala ma ghọta na anyị chọrọ mgbanwe na obodo a.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *