Take a fresh look at your lifestyle.

 UNICEF ji ihe nkuzi kwado ụlọ akwụkwọ  na Steeti Adamawa

WUMI SAM dere ya na bekee.

0 265

UNICEF ji ihe nkuzi kwado ụlọ akwụkwọ  na Steeti Adamawa

Otu Mba uwa n’ahụ maka ụmụaka (UNICEF) akwadola ụlọ akwụkwọ di iri naSteeti Adamawa na ihe eji akuzi  nkuzi iji kwalite nkuzi na mmụta n’ụlọ akwụkwọ ọha di na steeti ahụ.

Onye isi ụlọ ọrụ  ahụ na Bauchi, Mr Abdulrahman Ibrahim, ka ọ na-ekesa ihe nkuzi na Yola, kwuru na e nyere ihe ndi a iji kwalite agụmụ akwukwo.

Ọ gwakwara ụlọ akwụkwọ ndị na-erite uru a ka ha jiri ihe ndị a na-emeputa ihe iji belata oke nkwụsị  ejeghi akwụkwọ na steeti ahụ.

Ka ọ dị ugbu a, Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mmepe ego mmadụ, Wulbina Jackson, kelere onyinye UNICEF na ndị mmekọ ndị ọzọ iji kwalite ohere agụmakwụkwọ dị mma na steeti ahụ. N’okwu ya, onye isi oche nke Adamawa State Universal Basic Education (ADSUBEB), Dr Salihi Atequ, kwuru na a ga-eji ngwa ahụ mee ihe n’ụzọ ziri ezi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *