Take a fresh look at your lifestyle.

Naịjirịa akpọlatala ihe ruru mmadụ nari asato ọzọ site na mba Sudan

0 319

Ụfọdụ ụmụafọ Naịjriịa ọzọ bụ ndị tọburu na Sudan atụọla ụkwụ n’ọdụ ụgbọelu Abụja. Ndị a lọghachitere Naịjirịa n’ụbọchị Sọnde, abalị asaa nke ọnwa Mee. 2023.

Nke a so agba nke anọ na amịta mkpụrụ n’atụmatụ mkpọlata ụmụafọ Naịjirịa tọrọ na Sudan ebe ọgbaghara na-adasiike nke gọọmentị Naịjirịa na-eme.

Mmadụ out nari na abuo n’ime ndị a so ụgbọelu Tarco Airlines si akụkụ Port Sudan lọta ebe mmadụ nari ato iri abuo na abuo so ụgbọelu Asman Air nke si akụkụ Aswan, mba Egypt. Ndị ọzọ so kwa ụgbọelu Azman.

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n’ime ya, họrọ ‘nabata na gaa n’ihu’.

Ndị nke si akụkụ ọdụ ụgbọelu Port Sudan International Airport lọta tụrụ n’ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n’Abuja n’elekere iri abuo na ọkara nke ehihe Sọnde a.

Nke a mere ya ihe karịrị nchịkọta mmadụ nari asato bụ ndị si Sudan lọta n’ụbọchị Sọnde a.

Cheta na ngalaba gbatagbata Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency (Nema) kwuburu na ọnụọgụgụ ndị a na-atụ anya ịlọbata na Naịjirịa n’ụbọchị Sọnde bụ nari asaa.

Edemede a nwere ihe ndị si na Twitter. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Twitter iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n’ime ya, họrọ ‘nabata na gaa n’ihu’.

N’ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị isii nke ọnwa Eprel, ụmụ Naịjirịa ọnụọgụgụ ha dị otu nari iri ato na otu – ndị okenye otu nari iri abuo na ano na ụmụ ntakịrị asaa – lọbatara n’ọdọ ụgbọelu Abuja n’ebe elekere mbụ na ọkara nke ehihie.

Ọ bụ ụgbọelu Tarco Aviation si obodo Port Sudan wee bulata ndị a. Ụgbọelu ọzọkwa si Port Sudan buru ụmụ Naịjirịa ọnụọgụgụ ha dị otu nari na abuo amalitekwala njem ilọghachi, dịka ndị isi Nema si kwuo.

A na-atụ anya ndị nke a n’ebe elekere ise na ọkara nke mgbede taa bụ Sọnde.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *