Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Abia kpebiri n’oge a na ike ọchịchị ọjọọ agwụla ha – Ginger Onwusibe

0 444

Ginger Onwusibe ji aha Labour Pati zọọ ọkwa ịnọchiteanya ndị Isiala-Ngwa North na South n’ụlọomeiwu nta ekwuola etu obi dị ya n’imeri na ntuliaka aka ahụ.

Na mkparịtaụka ya na ndi ntaakuko nwere, Onwusibe sị na obi dị ya ụtọ maka mmeri ahụ, na o kelere Chineke nakwa ndị Isiala Ngwa kwadoro ya.

Mgbe a jụrụ ya ma aha Peter Obi o nyere aka na mmeri ya, o kwuru n’ezie na Obi nyere aka na mmeri Labour pati n’Abia Steeti, kama na ihe ọzọ dị mkpa bụ agwa onye na-azọ ọkwa ahụ.

N’okwu ya “N’ezie Peter nyeere anyị aka maka na ọ bụ ezigbo mmadụ kama ihe ọzọ bụkwa omume onye na-azọ ọkwa.

“Ọ bụghị ikpojuo ndị ọjọọ n’ime pati gị, ị na-atụ anya ka i merie na ntuliaka.

“Ihe mere Labour pati jiri mee ọfụma na ntuliaka bụ na ike ọchịchị ọjọọ agwụla ndị Abia steeti.”

Onwusibe gara n’ihu kwuo na ihe nyere ya mmeri bụ maka ọrụ ọma ọ rụụrụ ndị Isiala Ngwa North mgbe ọ na-anọchite anya ha n’ụlọomeiwu Abia steeti.

O kwuru na ọ rụrụ ihe ndị gụnyere ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ, ụlọazụmaahịa, gbapeere ha mmiri, igwe ọkụ latrik dgz.

O kwere ndị Isiala Ngwa North na South nkwa na ọ ga-arụrụ ha ọrụ karịa nke ọ rụrụ mgbe ọ nọ n’ụlọomeiwu steeti.

“Enwere ihe e kwesịrị ịrụ n’Isiala Ngwa a na-arụbeghi kamgbe a na-akpọ ‘dry port’. Aga m ahụ na a rụrụ ya n’oge ọchịchị m.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *