Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọọrụ na-emepụta Peak Milk arịọla mgbaghara maka ozi ‘Easter’ ha nke ọha katọrọ

0 528

Ụlọọrụ na-emepụta mmiri ara ehi Peak bụ FrieslandCampina WAMCO Nigeria Plc arịọla otu jịkọrọ ndị ụka Kraịst na Naịjirịa bụ Christian Association of Nigeria (CAN) mgbaghara maka ozi ha zipụtara n’oge emume ncheta ọnwụ na mbilite Kraịst nke afọ a.

Ozi ha gosiri ka ha ji obe nke Kraịst were tinye na ozi ire ahịa ha na soshal midia n’ụbọchị ‘Good Friday’.

Ndị isi ụlọọrụ ahụ zipụta ozi na Twitter ha n’ụbọchị Tuzde rịọ ndị okpukperechi Kraịst na Naijirịa ka ha iwe dị ọkụ jụọ otu dịka ha kwuru na ha kwetere na ya bụ ozi bụ ihe nwereike ikpalite mmụọ nakwa iwe ndị mmadụ.

Ha gara n’ihu kwuo na ọ bụghi ebumnobi ha iji aja Kraịst chụrụ were rite uru ahịa dịka ozi kwuru na ha ewepụla oziu ahụ kpatara okwu.

Mgbe ozi gbara n’ọha, CAN wepụta ozi n’ụbọchị Mọnde ma kwuo na ya bụ ozi ụlọọrụ zipụtara na Fraịde ezighị ezi dịka ha kwuru na ha agaghị anabata ya ma ncha.

Ozi a nke odeakwụkwọ ha bụ Joseph Daramola binyereaka kwuru:

“Ụbọchị ‘Good Friday’ bụ ụbọchị dị nso nye ndị okpukerechi Kraịst n’ụwa niile… Ụbọchị a abụghị ụbọchị e ji eme ihe ire ahịa.”

Ihe dị etu a emebuola n’afọ 2022 mgbe ụlọakụ Sterling Bank wepụtara ozi ncheta ụbọchị ọnwụ na mbilite Kraịst, ọha ndị okpukperechi katọrọ ozi ha dịka CAN rụrụ ha aka.

Ozi ụlọakụ ahụ ji mbilite n’ọnwụ Kraịst tụnyere achịcha a ma ama na Legọs bụ achịcha ‘Agege’.

Ha merechara rịọ mgbaghara maka ihe a mere ma wepụ ya na soshal midia ha

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *