Take a fresh look at your lifestyle.

Germany ezigara Ukraine ụgbọala ogbunigwe bụ ọgbaraụwa gharịị

0 631

Mịnịstrị nchekwa nke mba Germany ekwuola na ha ezigarala mba Ukraine ụgbọala na-atụ ogbunigwe a kpọrọ ‘Leopard 2 Tank’ nke ụdị ya bụ ọgbaraụwa gharịị.

Ụgbọala ndị a -dị abụọ n’ọnụọgụ – so na nkwa enyemaka Germany kwere Ukraine n’agha ha na-alụ iji chekwaa mba ha na mwakpo mba Rọshịa wakporo ha.

Mịnịsta nchekwa mba Germany bụ Boris Pistorius kwuru na ha nwere olileanya na ụgbọala ndị ahụ ga-enyere Ukraine aka nke ukwuu n’ihu agha.

N’otu aka ahụ kwa, ụgbọala abụọ na-atụkwa ogbunigwe a kpọrọ ‘Challenger 2’ erukwaala mba Ukraine aka site na mba UK.

Ugboro ugboro ka mba Ukraiane na-akpọku mba Europe dị icheiche maka enyemaka ngwaọgụ, ego, nri na ihe ndị ọzọ n’agha mba Roshia na-ebuso ha.

Gọọmentị Ukraine ekwubeghị ma ha enwetala ụgbọala ‘Leopard 2’ abụọ ahụ si mba Germany, mana ha kwuru na ụgbọala ‘Challenger 2’ abụọ si mba UK erutela ha aka.

Mba UK kwuru na ndị agha mba Ukraine bịara nweta ọzụzụ maka etu e si anya ụgbọala ‘tank’ ndị ahụ alaghachila na mba ha.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *