Saatụ Afrika nabatara Eze Belgium.
Onye isi ala Saatụ Afrika, Cyril Ramaphosa anabatala Eze Philippe Belgium na Queen Mathilda n’ isi obodo Pretoria.
Ramaphosa kwusiri ike na ọrụ Belgium na-arụ n’ịkwado atụmatụ mbufe teknụzụ mRNA nke World Health Organisation hibere na South Africa iji kwalite ohere Africa na-enweta ọgwụ mgbochi na ọgwụgwọ.
“Achọrọ m igosipụta ekele anyị nye alaeze Belgium maka ọrụ ya na ọgụ zuru ụwa ọnụ megide COVID-19. Belgium bụ ihe dị mkpa na-enye aka na njikọ ọgwụ mgbochi GAVI, maka ọrụ COVAX, atụmatụ COVID-19 Vaccines Global Access, “Ramaphosa kwuru na mkparịta ụka ya na eze Belgium.
O kwuru na Belgium enyela ihe dị ka nde ọgwụ mgbochi 10 n’oge ọrịa a, yana oke dị ukwuu na-aga mba Africa chọrọ ọgwụ mgbochi.
Leave a Reply