Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’ihe mberede oke ifufe na mmiri ozuzo nke mere na mba Malawi na ngwụcha izuụka gara aga akarịala mmadu nari abụọ.
Nnukwu ide mmiri ka na-asọjukwa ọtụtụ obodo, na-akwatu ụlọ ndị mmadụ ma na-eburukwa ihe ọbụla nọchiri ya ụzọ, n’ihi ọdachi ọnatarachi a akpọrọ ‘Storm Freddy’.
Obodo Blantyre, nke bụ isi obodo azụmahịa nke mba Malawi bụ ebe ihe mberede a kacha metụta , ebe ahụ ka ndị mmadụ kacha nwụọ tinyere ọtụtụ ụmụ ntakịrị.
Ndị ọrụ enyemaka na-ekwu na oke ideimmiri a ga-eme ka ọrịa cholera nke na-efesabu na mba Malawi kawanye njọ.
Gọọmentị etinyela ọnọdụ gbatagbata na distrikt iri dị na mpaghara ndịda Malawi bụ ebe ọdachia ahụ kacha metụta.
“Anyị hụrụ ka osimiri juputara n’ọnụ na-awụfu, mmiri a na-eburu ma mmadụ ma ụlọ ọbụla nọ n’ụzọ ya,” onye ntaakụkọ Peter Kalaya kwuru.
Otu onye bi na Blantyre kwara ndi ntaakuko etu ya na ndị ọzọ si zọpụta otu nwatakịrị nwaanyị tọrọ atọ n’ime aja ụrọ.
“Aja ụrọ obere ka o kpuchie nwata ahụ isi. Ọ nọ na-ebe akwa na-eti mkpu enyemaka. N’agbanyeghị na idemmiri na-ebusi ike, anyị gbalịrị gafee ma zọpụta nwata ahụ. Ọ dịghị mfe mana anyị jisiri ike mee ya,” nwoke ahụ aha ya bụ Aaron Ntambo kwuru.
Ndị ọrụ ahụike n’otu nnukwu ụlọọgwụ dị n’obodo ahụ sị na ọnụọgụgụ ozu mmadụ a na-ebubata n’ụlọọgwụ ahụ karịrị ha.
Otu enyemaka ahụike bụ ‘Doctors Without Borders’ kwuru na ihe karịrị ụmụaka iri ano ka e bubatara n’ozu n’ụlọọgwụ ahụ.
A na-eche na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’ihe mberede a ga-agbago n’ihi na ndị ọrụ enyemaka enwebeghị ike ịbanye n’ọtụtụ mpaghara n’ihi na oke mmiri ozuzo na oke ifufe ka na-ebusi ike n’ebe ndị ahụ.
Leave a Reply