Take a fresh look at your lifestyle.

Tinubu emeriela ntuliaka onyeisiala Naịjirịa 2023

0 369

Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri ntuliaka 2023 n’isi ụtụtụ ụbọchị Wenezde

Ngalaba nhazi ntuliaka na naịjirịa bụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) akpọpụtala Bola Ahmed Tinubu dịka onye meriri ntuliaka Onyeisiala Naịjirịa na 2023.

Patị atọ bụ All Progressives Congress (APC), Peoples Democratic Party (PDP) na Labour Party (LP) merichara steeti 12 n’otu n’otu na ntuliaka a, mana ọnụọgụgụ vootu nke APC nwetara kacha elu.

Na ngụkọ ikpeazụ, APC nwetara vootu 8,794,726, iji nweta mmeri; PDP nwetara vootu 6,984,520, ebe LP nwetara LP 6,101,533.

Steeti ebe Tinubu meriri gụnyere Ekiti, Osun, Kwara, Ondo, Ogun, Oyo, Jigawa, Niger, Benue, Kogi, Zamfara, na Rivers.

Atiku nke PDP meriri Yobe, Gombe, Adamawa, Katsina, Akwa Ibom, Bauchi, Bayelsa, Kaduna, Kebbi, Sokoto, Taraba na Osun.

Peter Obi nke Labour Party meriri Enugu, Lagos, Nasarawa, FCT Abuja, Edo, Abia, Plateau, Cross River, Delta, Ebonyi, Imo na Anambra.

Rabiu Musa Kwankwaso, onye nọ n’otu ‘New Nigeria Peoples Party (NNPP) meriri na Kano Steeti.

Onye ọbụla tinye aka ka anyị wulite Naịjirịa – Tinubu

Bola Tinubu akpọkuola ndị ya na ha so zọọ oche onyeisiala Naịjirịa, nakwa ndị Naịjirịa niile, ma ndị kwadoro ya ma ndị akwadoghi ya, ka onye ọbụla tinye aka iji wulite Naịjirịa.

O kwuru nke a dịka ọ na-anabata mmeri ya dịka onyeisiala ọhụrụ nke Naịjirịa.

“Ma ị dị Batified, ma ị dị Atikulated, ma ị dị Obidient, onye ọbụla tinye aka ugbua ka anyị wulite obodo anyị Naịjiria,” Tinubu kwuru.

Ọ gara n’ihu kelrr ndị niile nyere ya nkwado n’ụzọ dị icheiche na njem ịbụ onyeisiala.

Ntuliaka a doro onye ọbụ anya… Inec emeela

Tinubu toro Inec maka ịhazi ntuliaka doro onye ọbụla anya n’agbanyeghị obere ọdachi a hụtara n’ebe dị icheiche.

O kwuru sị: “Onweghị onye ga-ekwu na ya emehiebeghị ihe ọbụla na ndụ ya. Ọ bụrụgodi na e nwere obere mmehie n’ebe dị icheiche, ihe ndị ahụ enweghị ike imetụta mpụtara ntuliaka a niile.”

“Onye ọbụla hụrụ na ntuliaka a kwụ ọtọ ma dokwaa anya, anyị bụ ndị Naịjirịa na-ekwu ya, ndị mba ofesi na-ekwukwa ya.”

Afọ anọ ga-abụ afọ anọ maka ụmụakwụkwọ

Tinubu toro ndị ntorobịa nyere ya nkwado maka ịbụ onyeisiala, ma kwe nkwa na ọ ga-agbanwe ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naịjirịa.

“Ị chọọ ibite ego, ọ ga-adị. Onye chọrọ ibiri ego iji gụọ akwụkwọ, ọ ga-adị. Afọ anọ ga-abụ afọ anọ. Ndị nkuzi ịgba abụbụ ọrụ agaghị adịzi. Ụlọakwụkwọ mahadum ga-enwere onwe ha, ụnụ ga-enweta uru n’agụmakwụkwọ ụnụ,” Tinubu kwuru.

Olee mgbe Tinubu ga-ewere oche Onyeisiala?

N’abali iri abuo na itolu nke ọnwa Mee afọ a ka onyeisiala Muhammdu Buhari ga-awụsa ọwa ma rituo n’oche; n’ụbọchị ahụ kwa ka a ga-edu Bola Ahmed Tinubu n’iyi ọrụ dịka onyeisiala ọhụrụ.

Bola Tinubu achịbuola Legọs steeti dịka Gọvanọ malite na 1999 ruo 2003. O merikwara ntuliaka ịnọchite mpaghara Legọs West n’ụlọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa, mana onyeisiala oge ahụ bụ Sani Abacha kagburu ntuliaka ahụ e mere na June 12 1993.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *