Ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) yigharịrị nchịkọta na ọkwa ọkwa onyeisiala nke afọ 2023 n’elekere iri na otu nke ụtụtụ Mọnde,abali iri abuo na asaanke onwa Febụwarị. INEC n’ụbọchị ụka kwuputara nsonaazụ ntuliaka onye isi ala nke 2023 maka Ekiti Steeti na South-West Nigeria. Onye na-ahụ maka ịchịkọta ntuliaka onyeisiala INEC maka steeti Ekiti bụ Ọkammụta Akeem Olawale Lasisi wepụtara rịzọlt a n’ụlọọrụ nchịkọta ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023 na International Conference Centre dị n’Abuja. O kwuru na Bola Tinubu nke All Progressives Congress (APC) nwetara vootu 210,494 nke Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) nwetara vootu 89,554 sochiri ya. Peter Obi nke Labour Party (LP) nwetara vootu 11,397 ebe Rabiu Kwankwaso nke New Nigeria Peoples Party (NNPP) nwetara vootu 264. Onyeisi oche INEC bụ Mahmood Yakubu kwuru na kọmishọna na-atụ anya nsonaazụ steeti iri atọ na ise ndị ọzọ na Federal Capital Territory n’ụbọchị Mọnde.
Leave a Reply