Otu onye okenye steeti bụ Chiifu Emmanuel Iwuanyanwu kpọkuru ndị Igbo ka ha kwalite ọrụ ugbo na mpaghara ha iji gbanarị nsogbu ọnụ ahịa nri na-eche ndị Naijiria ihu. Iwuanyanwu kwuru nkea na ọgbakọ ndị obodo Mbaitoli/Ikeduru Federal constituency n’okpuru ọgbakọ ndị Mbaike nwere n’Owerri ụbọchị ụka. Iji nweta ya, a ga-etinye ala ọ bụla dara ada n’ọrụ ugbo iji mepụta nri. “Unu makwa na n’ihi nbilata nke ego naira, a na-enwe nnukwu onu ahia n’ihe oriri. ya mere, anyị ga-abanye n’ọrụ ugbo iji jiri ala ọ bụla dị na mpaghara anyị dozie nsogbu ndị a. “Anyị ga-eguzobe kọmitii na-ahụ maka ọrụ ugbo. Anyị ga-eji usoro anyị ugbu a gbachitere ndị anyị ma ghara ikwe ka egwu egwu. Nke ahụ bụ mgbe anyị ga-adị n’otu,” Iwuanyanwu kwuru.
Leave a Reply