Take a fresh look at your lifestyle.

“Ọ bụghị gọomentị Abia steeti kwesiri ịkwụ ndị dọkịta ABSUTH ụgwọ”

0 486

Otu jikọrọ ndị dọkịnta ekwuola na ha ga-aga abụbụọrụ n’ebe na Naịjirịa niile maọbụrụ na gọọmentị Abia steeti akwụghị ụgwọ e ji ha.

Ha kwuru na gọọmentị steeti ahụ ji ha ụgwọ ọnwa iri abụọ na anọ putara afọ abụo ma jụ ịkwụ ha ụgwọ.

Onyeisi otu ahụ bụ Emeka Innocent Orji gwara ndi ntaakuko sị “Ọ bụrụ na gọọmentị Abia steeti akwụghị ụgwọ a, ya atụna onye ọbụla n’anya na anyị ga-akwụsị ọrụ ileta ahụike na Naịjirịa niile maka ya. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee otu a jikọrọ anyị, njọ e mere otu bụ njọ e mere anyị niile.”

Orji kwukwara na gọọmentị ekwebuola ha nkwa ịkwụ ụgwọ ọnwa abụọ mgbe ha meburu abụbụọrụ nwa oge mana ha tụgharịrị azụ kwuo na “ego adịghị”.

Gịnị ka gọọmentị na-ekwu?

N’aka nke ha, gọọmentị Abia gwara ndi ntaakuko na o nweghi onye ha ji ụgwọ na steeti ahụ.

Kọmịshọna mgbasaozi bụ Eze Chikamnayo sị “o nweghi onye ọrụ gọọmentị ọbụla e ji ụgwọ”.

Ọ sị na ọ bụ ndị na-erụ n’okpuru ngalaba dị icheiche na-enwe nsogbu iji ụgwọ na steeti ahụ.

“Anyị nwere ndị dọkịta na-arụrụ gọọmentị ọrụ site na ngalaba ahụike, o nweghi ụgwọ e ji ndị ahụ” ka o kwuru.

Chikamnayo kwukwara na ọ bụghị ọrụ gọọmentị ịkwụ ndị ahụ nọ na ngalaba ụgwọ ọnwa n’ihi na nwere iwu ndị hibere ha ma nyekwa ha ikike ịkpata ego nke ha ịkwụ ndị ọrụ ha ụgwọ ebe gọọmentị nwereike ị na-enyere ha aka site n’inye onyinye.

Nke a pụtara na Abia state University Teaching Hospital and Health Management Board bụ ụdịrị ngalaba ahụ kwesiri ịkpata ego nke ha gụnyere ịkwụ ndị dọkịta ụgwọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *