Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ị ga-esi mata akwụkwọ naịra ọhụrụ adigboroja

0 493

Ụlọakụ etiti akọwala ihe njirimara dị icheiche mmadụ ga-eji mata ego naịra ọhụrụ nke ezigbo na nke adịgboroja.

N’akara websaịt CBN, ha dere sị: “E nwere njrirmara pụrụ iche nke mmadụ nwereike ịhụ n’anya maọbụ metụ aka iji mata nke bụ ezigbo ego naịra.

“Nke mbụ bụ na etu e si bipụta ya ga-eme ka mmadụ mata nke bụ ezigbo na nke adigboroja ngwangwa o metụrụ ya aka.

“Enwekwara ihe dịka eriri gara ogologo n’akwụkwọ ego ahụ, ọ ga-abụ mmadụ lee ya anya n’ọkụ, ọ ga-ahụ ka e ji kịrịkịrị mkpụrụedemede dee CBN n’ahụ ya.

Ihe ndị ọzọ gụnyere etu pụrụ iche e si dee ihe n’akwụkwọ ego ahụ.

Ha kọwakwara na akara njirimara akwụkwọ naịra ọbụla n-eji oji ma e were anya nkịtị lee ya, mana e tinye ya n’ọkụ, ọ ga-acha ndụndụ.

Ha gara n’ihu kwuo na ha na-agbanwe njirimara dị n’akwụkwọ naịra kwa mgbe kwa mgbe iji gbochie ndị na-akụ nke adigboroja.

Gịnị mere ụlọakụ ka ji enye ndị mmadụ ego naịra ochie?

Gịnị mere ụlọakụ ka ji enye ndị mmadụ ego naịra ochie?

Nkesa akwụkwọ ego naịra ọhụrụ nke ụlọakụ etiti Naịjirịa wepụtara kwesịrị ịmalite n’ụbọchị iri na ise nke ọnwa Disemba 2022, mana ruo taa, Disemba 2020, ụlọakụ dị icheiche na Naịjirịa ka na-enye ndị mmadụ akwụkwọ naịra ochie.

Nke a emeela ka ọtụtụ ndị mmadụ na-eti mkpu ma na-ajụ sị, kedụzi ebe naịra ọhụrụ a dị?

Ekwesịrị ịmalite ikesa ego naịra ọhụrụ a n’abali iri na ise nke onwa Disemba

Otu onye aha ya bụ Oluchi Alabi gwara ndi ntaakuko na ya gara ụlọakụ n’ụbọchị Mọnde ịdọrọ puku naịra iri na ise n’ọbaego ya, mana ọ bụ ego ochie ka e nyere ya.

“Oge m jụrụ ha ihe kpatara nke a, onye ụlọakụ ahụ nyere m naanị otu puku naịra nke ọhụrụ, nyezie m puku naịra 14 n’ego ochie, lefuo anya,” Oluchi kwuru.

Onye ọzọ bụ Halima kwuru na ya gara ịdọrọ ego n’ụlọakụ dị n’Ilorin, Kwara steeti, mana ọ bụkwa ego ochie ka ha na-akwụ.

“N’ihi na onye ahụ na-akwụ ụgwọ bụ nwanne m nwaanyị, o nyere m puku naịra ise n’ego ọhụrụ. Mgbe ndị mmadụ hụrụ na o nyere m ego ọhụrụ, ha malitere ịgbata n’akụkụ nke ya, mana ọ gwara ha na ọ bụ naanị ego ọhụrụ puku naịra iri ka ụlọakụ nyere ya ka o nye ndị mmadụ,” Halima kwuru.

Ndị na-ere ego na mmemme nwere ego ọhụrụ a n’uju

Ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola na ha ahụla ebe ndị na-ere naịra ‘mint’ na mme bu ego ọhụrụ a n’uju.

Otu onye aha ya bụ Adeleke Opeyemi na Twitter tinyere onyonyo ebe otu onye na-ere ego bu ego ọhụrụ ahụ na-ere ya n’otu mmemme.

Opeyemi dere sị: “Ụmụ Naịjirịa ga-achọtarịrị ụzọ ha ga-esi mebie iwu. Lee ego ọhụrụ nke ụlọakụ na-anaghị enye ndị mmadụ, ya ka ndị na-atụ mgbere na-ere n’uju na mmemme.”

Chetakwa na ịre naịra bụ ihe megidere iwu dịka ụlọakụ etiti si kwuo, mana ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ere naịra ‘mint’ na mmemme n’ebe dị icheiche na Naịjirịa na-enweghị mmachi ọbụla.

Muyiwa Adejobi, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii, ndị ọ bụ ọrụ ha ijide ndị na-ere naịra, azaghị oku nakwa ozi anyi zigaara ya ka o tinye ọnụ n’okwu a.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ebokwa ebubo na ihe mere naịra ọhụrụ a ji akọ ụkọ bụ na ndị ide ego na-ebukọrọ ya na-edebe. Mana ndi ntaakuko agaghị ekwunwu ugbua na nke a bụ ihe na-eme eme.

Ọtụtụ na-ekwukwa na ndị ekperima ewepụtala adịgboroja akwụkwọ naịra ọhụrụ a, nke mere na ndị mmadụ amakwaghị nke bụ nke ezigbo na nke bụ nke adigboroja.

Katch Ononuju bụ onye okachamara n’okwu ego na akụnụba

Katch Ononuju, bụ onye okwu gbasara ego na akụnụba doro anya, gwara BBC Igbo na ọ gbaghị ya gharịị na ụfọdụ ụlọakụ ka na-akwụ ndị mmadụ naịra ochie.

“Ndị ụlọakụ ga na-enye ndị mmadụ ego ọhụrụ dịka ha si enweta ya n’aka CBN. Ọ bụ ihe e ji nwayọ nwayọ eme. oge ka dị,” Ononuju kwuru.

“O nwereike ịbụ eziokwu na ụfọdụ ndị na-arụ n’ụlọakụ nwereike ijichi ụfọdụ ego ọhụrụ ndị a iji nye ya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ resi ya ndị na-ere ego, mana ọ bụ ọrụ dịịrị ndị ọrụ nchekwa inyochapụta nke a, kwụsị ya, ma nye ndị aka ha dị na ya ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.”

Ihe CBN kwuru

CBN kwuru na a ga na-eri ego naịra ochie ruo abali iri ato na otu nke ọnwa Jenụwarị 2023.

Ọnụ na-ekwuru ndị CBN bụ Isaac Okoroafor azaghị oku ekwentị ndi ntaakuko kpọrọ ya ugboro ugboro.

Mana ozi dị n’akara Twitter CBN kwuru na a ga na-eri ego ochie ruo ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *