Take a fresh look at your lifestyle.

Edere m akwụkwọ arụkwaghịm kamgbe 2013 – Pope Francis

0 342

Pope Francis gbara afọ iri asatọ na isii n’ụbọchị Satọde,abali iri na asaa nke onwa Disemba afo 2013                                                                                Pope Francis gbara afọ iri asatọ na isii n’ụbọchị Satọde,abali iri na asaa nke onwa Disemba

Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa niile bụ Pope Francis ekwuola na ya dere akwụkwọ ịgba arụkwaghị m n’afọ 2013 ma binye ya aka, maka ikekwe ọ bụrụ na ahụike ya enyeghị ya ohere ịrọ ọrụ ya etu o kwesịrị dịka Pope.

Pope Francis kwupụtara nke a na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ bụ nke e bipụtara taa bụ Sọnde, dịka o mere ncheta ọmụmụ ya nke afọ iri asatọ na isii n’ụbọchị Satọde, Disemba 16, 2022.

O kwuru na onye o nyere akwụkwọ arụkwaghịm ahụ n’aka bụ Kadịnal Tarcisio Bertone, onye ji ọkwa odeakwụkwọ na Vatican n’oge ahụ.

Pope Francis ekwuola ugboro ugboro na ọ gaghị egbu oge ọbụla iritu n’ọkwa ‘Pope’ ma ọ bụrụ na ọnọdụ ahụike ya dị njọ ma gbochie ya ịrụ ọrụ ya dịka o kwesịrị.

“Edeela akwụkwọ arụkwaghịm, binye ya aka. Tarcisio Bertone bụ odeakwụkwọ n’oge ahụ. Enyere m ya akwụkwọ ahụ sị ya: ‘ọ bụrụ na ahụike maọbụ ihe ọbụla egbochie m ịrụ ọrụ m, lekwa akwụkwọ arụkwaghị m,” Pope Francis kwuru na mkparịtaụka ahụ.

“Amaghị m onye Kadịnal Bertone nyefere akwụkwọ ahụ, mana enyerem ya oge o ji ọkwa Odeakwụkwọ Obodo.”

Pope Francis kwukwara na nke a bụ nke mbụ ọ na-ekwupụta ya bụ ihe.

Onye nọbụ n’ọkwa Pope bụ Benedict XVI, dị afọ 95 ugbua, bụ Pope mbụ n’ime ihe karịrị afọ narị isii, rituru n’ọkwa n’ihi na ahụ esichaghị ya ike, na 2013.

Tupu oge ahụ, onye ọbụla bụ Pope ga-ejigide ya bụ ọkwa ruo n’ọnwụ.

Pope Francis ka gbasiri ike ugbua, mana ọ na-enwe nsogbu ihe mgbu n’ikpere ya, nke na-eme ka ọ na-eji mkpọ maọbụ igwe ‘wheelchair’ wee na-akpagharị.

Kamgbe ọnwa Julaị afọ a, Pope Francis agaala njem nleta na mba Kanada, Kazakstan, na Bahrain, ọ na-elekwa anya ịga mba DR Congo nakwa Saụt Sudan n’ọnwa Jenụwarị na Febrụwarị afọ 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *