Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ekperima awakpola ụlọọrụ Inec dị n’Oru West

0 1,141

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka n’ala Naijiria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuola na ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ha dị n’okpuru ọchịchị Oru West n’Imo steeti.

Dịka Inec si depụta n’akara Twitter ha, mwakpo a mere n’ebe elekere anọ nke isi ụtụtụ taa bụ Sọnde.

Nke a na-abịa dịka ndị ekperima wakpokwara ụlọọrụ Inec dị n’Ọrlu Imo steeti.

Inec kwuru na nke a na-eme ya ụlọọrụ ha nke asaa a na-awakpo n’ime ọnwa anọ gara aga na steeti ise dị na Naịjirịa.

Akwụkwọ ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye zipụtara taa bụ Sọnde kwuru na ọ bụ onyeisi ha n’Imo steeti bụ Sylvia Uchenna Agu gbara ama mwakpo ahụ.

Ha kwuru na ebe ndị ekperima ahụ gbara ọkụ bụ ‘conference room’ nke mebiri oche, tebulu na ihe ndị ọzọ dị ebe ahụ, mana ọkụ ahụ emetụghị ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa Inec ji arụ ọrụ.

Inec kwukwara ọzọ na mwakpo ndị a nke a na-awakpo ụlọọrụ ha na steeti dị icheiche na Naịjirịa nwereike imetụta nhazi ntuliaka nke 2023 ma ọ bụrụ na o mere na-aga n’ihu.

Ha kwukwara na ha emeela ka ndịọrụ nchekwa mara maka mwakpo nke a

Ọnọdụ nchekwa ọjọọ agaghị akwụsị ntuliaka 2023 – Inec

Na mkparịtaụka Festus Okoye na ndị ntaakụkọ Channels nwere n’ọdị nso a, o kwuru na ntuliaka 2023 ga-aga n’ihu n’agbanyeghị mwakpo ndị a niile.

O kwuru sị: “Achọrọ m ime ka onye ọbụla mara na enweghị akụrụngwa ndị dị mkpa a ga-eji mee ntuliaka dị n’ụlọọrụ anyị ndị a na-awakpo.

“Anyị echekwaala akụrụngwa BVAS nakwa ihe ndị ọzọ. Ntuliaka 2023 ga-agarịrị n’ihu dịka anyị si akwado ya.

“Mana ọ bụrụ na mwakpo ndị a na-aga n’ihu dịka ntuliaka na-abịawanye nso, o nwereike isiwanye ike iwetaghachi ihe niile ndị e mebiri emebi.

“Ya mere o ji dị mkpa ichekwa ụlọọrụ anyị ma gbochie mwakpo ndị a.”

Enweghị nchekwa na-arị elu n’Imo steeti

Ọnọdụ enweghị nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ebe Imo Steeti dị.

Mana ọ kawanyere njọ mgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ma jichie Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu ‘Indigenous People of Biafra’ (Ipob), ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe Biafra.

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ ndị Ipob nakwa ndị ọgụ ha kpọrọ onwe ha ‘Eastern Security Network’ (ESN), na-akpa ike ọjọọ a na mpaghara ala Igbo, mana Ipob na ESN kwuru na ọbụghị ha.

N’ọdị nso a, enweela mwakpo n’ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ gọọmentị dị icheiche na steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Iji wulite ọnọdụ nchekwa, gọọmentị Imo steeti hibere otu nche nke ha a kpọrọ ‘Ebube Agu’, bụ ndị ọrụ ha bụ inyere ndị ọrụ nchekwa aka ma gbochie mpụ.

Mana ọtụtụ mmadụ ebola ndị ‘Ebube Agu’ a ebubo aka ike nakwa ịkpagbu na igbu ndị aka ha dị ọcha.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *