Ụlọikpe mkpegharị ikpe ekwupụtala Binani ka ọ bụrụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ APC steeti na Adamawa .
Golfa Francis, Adamawa dere ya na bekee.
Ụlọikpe mkpegharị ikpe ekwupụtala Binani ka ọ bụrụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ
APC steeti na Adamawa .
Ụlọ ikpe mkpegharị ikpe nọ na Yola ekwupụtala Sinetọ Aishatu Dahiru Binani dị ka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Adamawa steeti maka ntuliaka izugbe nke 2023.
Ụlọ ikpe nke ndị ọkaikpe Tani Yusuf Hassan, Bolaji, na James Abodego nọ n’isi ya wepụrụ ikpe ụlọikpe ukwu dị na Yola bụ nke bu ụzọ kagbuo ntuliaka primarị nke gọvanọ nke APC na-ekwupụta na pati ahụ enweghị onye ga-azọ ntuliaka na-abịa.
Ụlọikpe mkpegharị ikpe mgbe ọ na-ekpe ikpe ya nyere iwu ka aha Sinetọ Aishatu Dahiru Binani nyefee Ụlọọrụ Independent Electoral Commission ozugbo.
Leave a Reply