Nhoputa ndi ochichi nke Imo, Bayelsa na Kogi steeti ga-eme na Nọvemba 11, 2023, dika Independent National Electoral Commission (INEC) siri kwuo. Kọmishọna ahụ mere ka a mara nke a na nzukọ ha na-enwe kwa izu na Tuzdee. Festus Okoye, bụ Kọmishọna Mba INEC na onyeisi oche na-ahụ maka mgbasa ozi na kọmitii na-agụ voter, kwadoro mmepe ahụ na nkwupụta o binyere aka na Tuesday. Okoye kwuru na akwadoro ntuli aka ndị otu pati n’abali iri abụọna asaa nke onwa Maachị ruo abali iri na asaa nke onwa Eprel afo, 2023. Okoye kwuru na mkpebi a bụ mmezu nke ihe a chọrọ na ngalaba iri abuo na asato nkeji mbu 28(1) nke iwu ntuli aka 2022, nyere INEC iwu ka ha bipụta ọkwa ntuli aka na-erughị ụbọchị 360 tupu ụbọchị edobere maka ntuli aka ahụ. Ndị ọkaiwu na-ahụ maka ntuliaka gara n’ihu kwuo na oge Gọvanọ Imo steeti nọ n’ọchịchị ga-agwụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Jenụarị afọ 2024 ebe ndị Kogi na Bayelsa steeti ga-agwụ n’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Jenụwarị 2024 na ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Febụwarị 2024 n’otu n’otu. INEC kwukwara na a ga-ebipụta akwụkwọ ikike maka ntuliaka gọvanọ na steeti atọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Nọvemba 2022.
Leave a Reply