Take a fresh look at your lifestyle.

A chọpụtala okporo ọzọ e si ezupu mmanụ agbidi na Naịjirịa

0 561

Ndị ọrụ nchekwa okporo mmanụ agbidi nke gọọmentị etiti hiwere achọpụtala ebe ọzọ e si ezupu mmanụ a dị n’Obodo Okuntu nke Delta Steetị na ngwụcha izuụka a.

Okporo mmanụ a dị inchisi isii ka a kwụnyere n’okporo mmanụ ukwu ụlọọrụ Shell a kpọrọ Trans Forcados Trunkline dị inchisi iri ise na asatọ (58) ma jiri ya mịrị mmanụ agbidi gawa na ngwaọrụ ndị Agid a gbahapụrụ agbahapụ dị n’oke osimmiri.

Ndị nchekwa Tantita a nke Government Ekpemupolo nọ n’isi sị na nyocha gosiri na e jiri okporo ahụ amị mmanụ agbidi na nzuzo kamgbe ihe ruru afọ atọ ma karịa.

Ụlọọrụ nchekwa a chọpụtala ihe karịrị okporo mmanụ adịgborojia iri ise e ji ezupu mmanụ agbịdị na Naịjirịa site Delta nakwa Bayelsa Steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *