Take a fresh look at your lifestyle.

Ka esi nabata Igbe Ezenwaanyị Elizabeth II n’Obieze Buckingham

0 529

Ndị mmadụ kwụ n’ahịrị na mpụta Obieze Buckingham tipuru mkpu dịka ụgbọala bụ ahụ Ezenwaanyị Elizabeth II nwụrụ banyere n’Obieze ahụ.

Eze Charles III, ụmụ ya abụọ bụ Ọkparaeze William na Ọkparaeze Harry nakwa ndị ezinaụlọ ya niile so na ndị nabatara ahụ ya.

Ndị mmadụ tiri sị ‘zuo ike n’udo!’ dịka ụgbọala ahụ gbafere ha.

Dịka ọ dị ugbua, Eze Charles na nwunye ya bụ Ezenwaanyị (Consort) ahapụla obieze Buckingham ahụ.

Cheta na njem a maliter kemgbe elekere iri n’ụtụtụ ụbọchị ụka mgbe ha hapụrụ Balmoral ebe Ezenwaanyị nwụrụ.

Puku kwuru puku mmadụ pụtara kwụrụ n’ahịrị site na mpụta London banye n’ime ya iji nweike hụ Ezenwaanyị ha na njem ikpeazụ ya.

Ahu Ezenwaanyị ga-anọ n’Obieze a otu abali tupu e bupu ya na Hallụ Westminster ebe ndị mmadụ ga-enweike ịbịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Ihe ga-eme n’ụbọchị Wenzde n’usoro akwamozu Ezenwaanyị

Ndị obodo ga-edu ahụ Ezenwaanyị site Buckingham Palace gawa Westminster dịka okụchara 14:00.

A ga-eji ụgbọ eji ebu nnukwu egbe nke ndị agha Eze nke Royal Horse Artillery, ndị agha na ndị ezinụlọ Eze ga-eso kwa ya.

Eze Charles ga-edu ndị a dịka ọ ga-eso igbe ozu a n’azụ, nke a ga-eji okọlọtọ Royal Standard kpuchie.

Igwe mmadụ nwereike ilele njem a dịka ha si Queen’s Garden, The Mall, Horse Guards, Horse Guards Arch, Whitehall, Parliament Street, Parliament Square na New Palace Yard. A na-eche na njem a ga-ewe nkeji iri ano.

A ga-enwe nnukwu ihe onyonyo maka emume a na capital’s Royal Parks.

A ga-edowe igbe ozu ya, na-ebe dị elu nke a na-akpọ Catafalque, n’okpuru Imperial State Crown, orb na sceptre, na Westminster.

Ndị agha nke Roral Household ga-echekwa akụkụ ebe a niile oge niile n’ụbọchị.

Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby ga-aka ụka obere oge nke Eze Charles na ndị ezinụlọ eze ọzọ tupu enye ndị ọha ohere ịbata.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *