Ụfọdụ na-ekwu na Peter Obi, onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ‘Labour Party’, na-ada iwu site n’ịrịọ enyemaka na mba ofesi maka ọkwa ọ na-azọ.
Peter Obi ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria, asaala ndị na-ekwu na ọ natara ego n’aka ndị bi mba ofesi maka achụmnta vootu.
Obi kwuru hoo haa na ọ nataghị nde dọla otu narị na iri ise ($150m), n’aka ndị nọ mba ofesi.
Nke a na-abịa dịka otu a kpọrọ Tinubu-Shettima Connect, na-akwado ndị na-azọ ọkwa onyeisiala n’okpuru pati All Progressives Congress (APC), gwara ndị Independent National Electoral Commission (Inec) ka ha kagbuo ikike Obi nwere iji zọọ ọkwa.
Ha kwuru na ọ dara iwu gbasara etu e si eweta ego e ji achụ nta vootu, nke dị n’iwu Electoral Act nke afọ 2022.
Lee ihe iwu kwuru gbasara isi mba ofesi webata ego e ji azọ ndọrọndọrọ ọchịchị
Ọkaiwu ukwu gbasara akwụkwọ iwu Naịjirịa bụ Malachy Ugwummadu akọwala ihe iwu kwuru maka isi mba ofesi bubata ego e ji eme ntuliaka na Naịjirịa.
Ugwummadu nyere nkọwa a dịka a na-enwe nrụrịtaụka na soshal midia gbasara ikwe ka ndị bi mba ofesi tụta ego iji kwadoo onye na-azọ ọchịchị na Naịjirịa.
Nrụrịtaụka a malitere n’ihi njem Peter Obi na-eme na mba ofesi iji kọwaara ụmụ Naịjirịa bi ebe ahụ maka ọkwa ọ na-azọ.
Pete Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ‘Labour Party’.
Dịka Ugwummadu si kọwaa, amaokwu nke 225 (3) (b) nke iwu Naịjirịa kwuru na “iwu medigere pati ọbụla ịnata maọbụ ịbụbata ego site na mba ofesi ma dowe (retain) ya bụ ego”.
“Mana ya bụ iwu amachighị “mmadụ nkịtị” ịnata ego dị otu a, ọkachasị ma ọ bụrụ na ọ bụ ndị Naịjirịa bị n’ofesi tụtara ya bụ ego.”
“Ọ bụ pati ka ya bụ iwu na-agwa, ọ bụghị mmadụ”.
Ugwummadu kọwara na ọ bụ eziokwu na iwu a ekwughị ma ọ bụ ndị Naịjirịa maọbụ ndị mba ọzọ, mana ya na-eche na “ya bụ iwu agaghị akwụsị ndị Naịjirịa ịsonye na ihe a na-eme n’ala nna ha site na ịtụ ego kwadọ onye ọbụla ha chọrọ”.
Ọ kọwara na ọ bụrụ na gọomentị kwụsị ndị dị Naịjirịa bi ofesi ịkwado onye ha chọrọ maka ọkwa onyeisiala, nke ahụ ga-abụ imegide ikike dịịrị ha dịka ọ dị n’akwụkwọ iwu “African Charter of Human Rights” nakwa akwụkwọ iwu Naịjirịa.
Ihe iwu kwuru maka otu ndọrọndọrọ ọchịchị ịnata ego site na mba ofesi
O kwukwara na amaokwu 84 nke iwu ntuliaka bụ ‘Electoral Act” na Bekee kwuru na onye ọbụla dara iwu ahụ ga-akwụ nha nde naịra ise maọbụ onye ahụ agaa mkpọrọ.
O nyekwara ikike gọomentị ịkpachị ya bụ ego ma taa pati ahụ ahụhụ ka o kwesiri.
Agummadu sị na ya che na iwu ahụ chọrọ ịgbochi ọnọdụ ebe ndị mba ofesi ga-eji ego na-eme ihe dị ha mma na Naịjirịa.
Ya bụ akwụkwọ iwu hikwara asaa n’anya wee kwuo na ya bụ iwu dị ire naanị mgbe pati ahụ kpachara anya “dowe” ya bụ ego.
Ọ sị na iwu ekwughị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na pati ahụ tinye ya bụ ego na ọrụ ozugbo ozugbo.
Agummadu kwuru na ọ bụrụ na ego mmadụ si mba ofesi nweta akarịghị ego ole iwu kwuru maka ịchụ nta vootu, na ya ahụghị nsogbu dị na ya.
O kwuru na “akwụkwọ iwu agbarụghị ihu maka ihe na-eme ugba maka na Peter Obi maọbụ Labour Pati ekwubeghị na ọ nwere ndị na akwụnye ha ụgwọ”.
Ọ sị na “crowd funding” abụghị njọ n’akwụkwọ iwu ọgwụchaa ma ọ bụ ndị ndị abụghị ndị Naịjirịa tụtara ya bụ ego.
Leave a Reply