Take a fresh look at your lifestyle.

Orji Uzor Kalu ji ọnọdụ nchekwa Abia North eme ndọrọ ndọrọ – Gọọmentị Abia steeti

0 506

Gọọmentị Abia Steeti akatọọla ihe Orji Uzor Kalu na-anọchiteanya Abia North na sineti kwuru maka ọnọdụ nchekwa na mpaghara Umunneochi, Lokpanta, Ohafia dgz.

Kọmishọna mgbasaozi bụ Eze Chikamnayo gwara ndi ntaakukọ na ọ bụ eziokwu na ọnọdụ nchekwa na mpaghara ndị a dị njọ ugbua.

“Anyị na-atụ anya na Orji Uzor na-anọchite anya mpaghara ndị a ekwesịla ikwu okwu banyere ya n’ụlọomeiwu kamgbe”

“Ọ bụ ihe mwute nye gọọmentị Abia na Kalu gbara nkịtị kamgbe ahụ mana rute ugbua ọ chọrọ ịzọ ndọrọ ndọrọ ọ bịa na-ekwu maka nchekwa.”

Chikamnayo sị na Kalu akpọtụbeghi gọọmentị Abia banyere ọnọdụ nchekwa dị na mpaghara ndị a.

“Ọ kpọtụbeghi gọọmentị Abia, o nwebeghi ihe ọbụla o merela maọbụ kwuo n’ụlọomeiwu maka ọnọdụ nchekwa na-adịghị mma n’obodo ndị a.”

Ọ sị na ọ bụrụ na ụdị ihe a mee, na ndị otu Kalu n’ụlọomeiwu ga-akpọ ya mkpa ime ka ndị ụlọomeiwu mara ihe na-eme.

Chikamnayo sị na ihe Kalu na-ekwu ugbua bụ okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ihe nchekwa abụghi maka ndọrọ.

“Anyị na-adọ Orji Uzor Kalu aka na ntị ka ọ kwụsị iji okwu nchekwa Umunneochi, Isuikwuatọ na Abia North eme ndọrọ ndọrọ ọchịchị”.

“Ọ bụ ihe dị oke mkpa, ọ bụghị ihe e ji egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”

Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmentị Abia akwadola komitii ha hiwere maka nchekwa na mpaghara ahụ, bunye ha ụgbọala nakwa ngwa ọrụ dị iche iche.

Kedụ ihe Orji Uzor Kalu kwuru?

N’ihe onyonyo Kalu tinyere na Facebook ya n’abali iri abụọ nke ọnwa Ọgọstụ 2022, o kwuru na ha ga-azacha ma kpochaa ime ọhịa niile dị n’Umunneochi, Arochukwu nakwa Ohafia nke Abia North.

Kalu sị na a ga-eme nke a iji chụpụsịa ndị ekperima ji ime ọhịa ndị a mere ogige ntọrị ndị mmadụ.

Ọ sị na ọ ga-eme ka gọomentị Abia steeti mata atụmatụ a ma mekwaa ka gọọmentị etiti nye aka.

Kalu gara n’ihu dọọ ndị nne na nna aka na ntị ka ha kwụsị ụmụ ha ịbanye n’ime ọhịa na mpaghara ndị a ọkachasị n’ime abalị.

Ọ sị na ndị ọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndịagha, ndị uweojii dgz ga-agbakọ aka ime nzacha na mkpocha ahụ.

Ndi ntaakukọ kpọtụụrụ Uzor Kalu ka ọ kọwaa etu nzacha ndị a ga-esi aga mana ọ zaghị ekwentị ya.

Gịnị mere mpaghara ndị a ji ekpo ọkụ n’okwu nchekwa?

Ọ bụghịzị ihe ọhụrụ na mpaghara Umunneochi, Lokpanta, Isuikwuatọ na ebe ndị ọzọ dị n’Abia North so n’ebe ndị ntọrị na-akpa ike.

N’ime afọ 2022, a tọrọla ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere onyeisi ụka Methodist na Naịjirịa bụ Uche Kanu, ndị Fada, ndị Sista nakwa Seminarian ụka Katọlik n’okporoụzọ dị na mpaghara a.

Nke a mere ime njem n’ogbe ndị a ji bụrụ ihe a na-akpachapụ anya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *