Take a fresh look at your lifestyle.

NBA conference 2022: Ihe Peter Obi, Atiku na Tinubu kwuru ha ga-eme ma ha zọta ọchịchị

0 550

Peter Obi na Atiku Abubakar bịara mana Bola Tinubu zigara osote ya bụ Kashim Shettima

Ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na Naịjiria bụ Atiku Abubakar, Peter Obi na Bola Ahmed Tinubu ekwuola ihe ha ga-emere Naịjiria ma ha zọta ọchịchị.

Ha tinyere ọnụ n’okwu gbasara akụnaụba obodo, nchekwa nakwa agụmakwụkwọ, dịka ha zara oku otu jikọtara ndị ọkaiwu na Naịjiria, Nigerian Bar Association (NBA) kpọrọ ha n’ọgbakọ ha malitere taa na Legọs.

Na ya bụ ọgbakọ, Atiku na Obi ji aka ha zara ọnụ ha, ebe Tinubu dinyere osote ya bụ Kashim Shettima ka ọ nọchite anya ya na ya bụ ọgbakọ.

“Aga m enyefe mahadum gọọmentị etiti n’aka ndị steeti” – Atiku

Atiku bụbu osote onyeisiala Naịjiria site n’afọ 1999 ruo afọ 2007, kwuru na ọ ga-ewere mahadum ndị nke gọọmentị etiti nwe nyefee ya n’aka gọọmentị steeti, ka ha nwee ike lekọta ya ọfụma.

Atiku na-azọ ọkwa onyeisiala n’okpuru Peoples Democratic Party (PDP) kwuru na ego gọọmentị etiti ejughi eju bara abara.

Atiku kwuru sị na “naanị otu ụzọ bụ ịhụ na obodo dịịrị onye ọbụla mma ọkachasị ndị ojiegoachụego nọ na Naịjiria na mba ofesi, ma ọ bụ na mwulite obodo, ma ọ bụ n’agụmakwụkwọ, ma ọ bụ n’ọkụ.”

O kwuru na ọ jụrụ otu onye ọkammụta na mahadum gọọmentị etiti sị “o doro gị anya na mahadum ndị mbụ anyị nwere nọbu n’okpuru gọọmentị mpaghara dị iche iche? Kedụ ndị nọchiri anya gọọmentị mpaghara ndị ahụ?”

Ọ gara n’ihu kwuo “Ụmụ unu na-eziga akwụkwọ na mba ofesi (Amerịka, Briten), kedụ ndị nwe mahadum ndị ahụ? Ọtụtụ n’ime ha abụghị nke gọọmentị. Gịnị mere i ji chee na anyị agaghị emeli ya ebe a? Anyị enweghi ego ahụ.”

“Itinye ego n’agụmakwụkwọ na ọkụ ga-ewulite akụnaụba obodo” – Obi

Obi na-azọ ọkwa onyeisiala n’okpuru Labour Party kwuru na ọ dị ezigbo mkpa itinye ego na mwulite agụmakwụkwọ na ọkụ, nke dị ezigbo mkpa maka mwulite akụnaụba obodo.

Obi kwuru sị “Ihe anyị kwesịrị ime bụ ihe abụọ dị oke mkpa: nchekwa na ịhụ na iwu dịkwa ire ọzọ…ọ dị mkpa ime ka obodo dị mma nke ga-arata ndị ojiegoachụego, ma wulite agụmakwụkwọ na ọkụ…ọ bụ ihe ndị a na-ewulite akụnaụba obodo”.

“Tinubu ga-eji ehihie chọwa ewu ojii” – Shettima

 

Shettima bụ osote Bola Ahmed Tinubu ji pati All Progressives Congress (APC) azọ ọkwa onyeisiala, kwuru na ha ga-ebido n’ehihie chọwa ewu ojii ma ha zọta ọchịchị.

O kwuru na “anyị ga-ebido n’ụbọchị mbụ rụwa ọrụ. Anyị ga-agbawa mbọ n’ihe gbasara akụnaụba, nchekwa na gburugburu ozugbo ozugbo.

“Anyị emebuola ihe a hụrụ anya. Arụrụ m ụfọdụ n’ime ụlọakwụkwọ kacha mma na Naịjiria. Gaa na Borno steeti ka ị hụ ihe iribeama; ị nweghi ike ikweta na ọ bụ steeti nọ n’etiti agha.

“Anyị ga-emepụta ụdịrị ọrụ ọma anyị rụru na Legọs nakwa Borno nakwa ụfọdụ steeti dị iche iche, iji hụ na mba anyị dị mma. Ihe dị mkpa bụ ezigbo ọchịchị.”

Cheta na otu jikọtara ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU), agabeghi ọrụ dịka ha gbara abụbụọrụ kemgbe abali iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

N’agbanyeghi na ha na gọọmentị enweela nzukọ ugboro ugboro, ha enwebeghi nkwekọrịta ga-eme ka ha malite ọrụ.

Ihe ha chọrọ n’aka gọọmentị gụnyere nlekọta, nṅogharị mahadum gọọmentị, tinyere ihe ndị ọzọ ha na-arịọ.

Chetakwa na ọtụtụ ebe na Naịjiria nọ n’ọnọdụ agba e kpere chi dịka ọnọdụ nchekwa n’ụfọdụ akụkụ Naịjiria banyere na nke onye na Chi ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *