Take a fresh look at your lifestyle.

Ụzọ anọ mwakpo ndị uweojii n’Ọwụwa Anyanwụ si emetụta ndi mmadu

0 470

Mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii, ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ abụghịzị akụkọ ọhụrụ n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nakwa mpaghara ndị ọzọ.

Ihe a na-emekwa n’akụkụ Naịjirịa dị icheiche na-emetụta ndụ ndị mmadụ n’ọtụtụ ụzọ.

Lee ihe ị kwesịrị ịma maka etu mwakpo ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ si emetụta gị.

Mwakpo ndị uweojii na-akpalite ndakpo nchekwa nakwa oke ihe egwu n’obodo niile.

Mmetụta akụnaụba ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ:

Obodo ọbụla nchekwa adịghị agaghị enwe ike rabata ndị ga-azụta ahịa na aka ha.

Ndị mmadụ agaghị enwe ike pụta zụọ ahịa n’udo.

Nke a bụ ihe otu onye ọkachamara n’ọrụ nchekwa bụ Richard Amuwa gwara ndi akuko Igbo.

Ọ gara n’ihu kwuo na ebe ọbụla ndị omekome jibidoro ma chụsaa ndị ọrụ nchekwa ebe ahụ ga-abụzị ebe ihe ọjọọ ga-agbako ụkwụ.

Enweghị nchekwa na-egbochi ndị mmadụ iga ọrụ ugbo nakwa ahịa nke na-akalịte agụụ n’ezinaụlọ nakwa n’obodo.

Mmetụta agụmakwụkọ:

Dịka isi okwu nke mbụ, ụmụakwụkwọ bụ ndị e kwesịrị ilebara anya n’ụzọ dị iche n’obodo ọbụla.

Dịka a na-awakpo ndị ọrụ nchekwa, ndakpo nchekwa ga na-arị elu n’obodo nke nwere ike ime ka ọtụtụ ndị nne na nna kwụsị ụmụ ha ịga akwụkwọ ka ha nwee ike labara ha anya.

Ndị nkuzi nwekwara ike ighara ị na-abịa ụlọakwụkwọ etu ha kwesịrị n’ihi ụjọọ mwakpo.

Ndị uweojii na-ahụ na mpụ anaghị arị elu n’obodo ọbụla.

Oke izu ohi, ntọrị ndị mmadụ nakwa mpụ ndị ọzọ:

Ihe na-eso eme ka ndị mmadụ sọọrọ ime mpụ ọbụla anya bụ na ndị uweojii na anọ n’ụzọ dị ịcheịche.

Ndị uweojii natara ọzụzụ ịnwe anya ime mmụọ iji nyochapụta onye mere mpụ maọbụ nwere ebumnobi ime mpụ.

Mgbe ọbụla ndị uweojii pụrụ n’ụzọ, akụkọ ihe dị egwu na-arị elu.

Iji maa atụ, mgbe e mere ngagharịiwe EndSars maka mmekpa ahụ ndị uweojii na Legos steeti n’afọ 2020, ọtụtụ ndị uweojii pụrụ n’ụzọ ebe ha na-anọ arụ ọrụ.

Akụkụ mwakpo, izu ohii, ntọrị ndị mmadụ, ọgbaghara n’okporoụzọ nakwa ihe egwu ndị ọzọ riri elu na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gbara BBC Igbo ama nke a ma kwuo sị, “Mwakpo ndị uweojii na-enye ndị ọjọọ ikike nakwa agbamume ime ndị nkiti ihe sọrọ ha n’ihi ndị uweojii agaghị enwe ike kwụsị atụmatụ ọjọọ ha”.

O gara n’ihu kwuo, “Ndị uweojii ga-ebu ụzọ chekwa onwe ha tupu ha enwe ike ichekwa obodo, ọ bụrụ na ebe ha-arụ ọrụ enweghị nchekwa ha agaghị enwe ike chekwa onwe ha ma fọduzie ichekwa obodo”.

Ndị uweojii na-arụ ọrụ nchekwa mgbe ndị ọzọ na-ehi ụra.

Mmetụta ahụike ndị mmadụ:

Ọtụ onye bi n’Enugu steeti aha ya bụ Chinazo gwara ndi ntaakuko na ọnọdụ ahụike ya ọkachasị ụbụrụisi ya akụdaala n’ụzọ ọjọọ.

O kwuru ‘Anyị anaghị apụta n’udo, mgbe ọbụla anyị chị obi n’aka”

“Dọkịnta m agwaala na ọbara m na-arị elu maka obi mmapụ nakwa ụjọ.” Chinazo kwuru na obi na-agbawa nke ukwuu n’ihi ya anaghịzị aga emume ụlọụka etu o siri agabụ na mbụ n’ihi ụjọọ ịlọta n’abalị”.

Otu dọkịnta aha ya bụ Udodi Okoli kwuru na mmadụ nọdụ n’ọnọdụ ụjọ nakwa obi mmapụ nke Bekee na-akpọ ‘Anxiety’ onye ahụ agaghị enwe ike bie ndụ ya n’uju.

O kwukwara na ọnọdụ nwereike imetụ etu onye ahụ si akpa agwaa n’ezinụlọ nakwa n’ụlọọrụ ya

Ndị uweojii na-arụ ọrụ ịhụ na ndị nkiti biri ndụ n’udo n’obodo niile.

Kedụ orụ ndị uweojii nke ndị mmadụ anaghị echeta?

Ihe ndị mmadụ na-echetakara maka ndị uweojii bụ etụ ha siri anwụchị ndị omekome mana ọrụ ha karịrị nke a. Ọrụ ndị uweojii gụnyere igbochi mpụ kpam kpam.

Ọrụ igbochi mpụ gụnyere inye ndị mmadụ ndụmọdụ maka etu ha ga-esi echekwa onwe ha. E nwere ọtụtụ ebe ndị dị mkpa ndị uweojii na-anọ arụ ọrụ ha.

Iji maa atụ, ndị uweojii nche n’okporoámá na-ichekwa udo obodo site n’ịtụ ntị n’ala oge niile, igbado anya ma na-eme nnyocha ụgbọala nakwa ibu ndị mmadụ bu agagharị.

Ewezuga ndị a, ndị mmadụ nwereike ibugharị ihe iwu mmachi, ozu ndị mmadụ, ego na-ezighị ezi, ngwa ọgụ nakwa ihe ọzọ aghara aghara nke nwereike itinye nchekwa na udo ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ.

Ndị uweojii na ndị ọrụ gọọmentị na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na-arụkọ dịka ndị ọrụ gbatagbata, ndị ọrụ gbatagbata mmenyụ ọkụ, ndị na-ahụ maka igbochi kpachị kpachị okporoụzọ, ndị agha, ndị ọrụ enyemaka n’agha, ndị nche obodo wdgz.

Ọ bụrụ na ihe ọdachị ọbụla mee, ndị uweojii na-eso na ndị mbụ na-agbapụta nyere ndị nkiti aka n’obodo ọbụla.

Ndị uweojii na-abụ ndị mbụ a na-ezigara ozi ma ihe ọbụla mee n’obodo ọkachasị ihe metụtara nchekwa, udo obodo, iwu obodo nakwa ihe ndị ọzọ dị aṅaa.

Ikpoku ndị ọrụ nchekwa ma ịhụ ihe ọbụla dị aṅaa gbasara nchekwa dị mkpa

Ihe ndị mmadụ nwereike ime maka mwakpo ndị a

Amuwa nyere ndụmọdụ na ndị mmadụ kwesịrị igbakọta aka ọnụ, sienye imi n’ala ma nyochapụta ndị na-arụ n’obodo ha.

O kwuru ndị mmadụ ekwesịghị ịtụ ụjọ n’izigara ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị gọọmentị aha ndị ha na-enyo bụ ndị omekome.

Ọ gara n’ihu rịọ ndị mmadụ ka ha mụta akara ekwentị ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ma marakwa ụzọ ndị ọzọ esi ezịgara ha ozi.

Amuwa kwukwara na “Ekweghị ekwu mere ọnụ, onye kwuo okwu, anụ olu ya ma gbapụta ya”.

Ọ kwọwara na e nwere atụmatụ a na-akpọ ‘See something, say something’ na Bekee.

N’atụmatụ ahụ pụtara na ndị obodo hụ onye ọbụla na ihe ọbụla dị aṅaa nwereike imetụta nchekwa nakwa udo obodo na ha kwesịrị ịtịpụ mkpu.

O kwukwara na otu ndị obodo kwesịrị ịjịkọaka gbakọta ụjọ azụ ma gbaa isi akwara ịhụ na echekwara ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị nkiti bi n’obodo ha.

Na nchịkọta, Amuwa kwukwara na “Ndị ọrụ nchekwa kwesịkwara inye ọha ọtụtụ ohere dị mfe iji zịgara ha ozi ọkachasị n’ime obodo ebe mwakpo ndị a na-arịzị elu”.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *