Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) adọtịala abụbọ ọrụ ha na-agba ruo izu anọ ọzọ.
Onyeisi otu a bụ Emmanuel Osodeke kwuru nke a taa bụ Mọnde dịka ọ kọwara na nke a bụ iji nye gọọmentị ohere ọzọ imezu nkwa ndị ha kwerela ha.
Osodeke kwuru na ndị otu mere nzukọ gbatagbata n’ụbọchị ụka n’Abuja maka nke a.
Cheta na e mechiri mahadum ndị nọ na Naịjirịa n’ihi ndị nkuzi nke otu Asuu malitere abụbọ ọrụ ha n’abali iri na anọ nke ọnwa Febụwarị,afọ 2022.
Asuu na-agba ya bụ abụbọ ọrụ maka ọnọdụ ọrụ ndị nkuzi mahadum nakwa etu ha sịrị gbajọọ imezu nkwa ndị Asuu sị gọọmentị etiti kwere ha nke gụnyere ibuli ego ụgwọ ọnwa ha.
Dịka Asuu na gọọmentị nọ na-asọkọtaisi n’okwu ihe ndị a, onyeisiala Muhammdu Buhari pụtara n’izu abụọ gara aga kwuo na ọ na-enye Minista agụmakwụkwọ nke Naịjirịa bụ Adamu Adamu na Chris Ngige bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ Bekee na Naịjriịa iwu ka ha hụ na ha kwụsịrị abụbọ ọrụ Asuu ma dajụọ iwe ha.
N’izu gara aga, otu ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress (NLC) pụtara n’igwe n’akụkụ Naịjirịa niile mee ngagharịiwe iji gosi nkwado ha n’abụbọ ọrụ Asuu n’agba.
Onyeisi NLC bụ Ayuba Wabba kwuru na ‘Ọ dị mwute na ụmụ ndị ọchịchị na Naịjirịa na-aga ofesi maka agụmakwụkwọ ha ebe ụmụ ndị nkiti nọ n’ụlọ maka abụbọ ọrụ Asuu’.
Leave a Reply