Onye isi APC na-agwa ndi otu ha ka ha mee ka ha dị n’otu.
Asma'u Halilu, n' Kaduna dere ya na bekee.
Onye isi APC na-agwa ndi otu ha ka ha mee ka ha dị n’otu.
Onye isi oche Northwest Zonal nke All Progressive Congress APC, Salihu Lukman akpọkuola ndị otu pati ahụ iwe were ka ha mee ka ha dị n’otu tupu ntuli aka izugbe 2023.
Lukman kpọrọ oku a na nzụkọ nke kọmitii na-eme udo haziri maka ndị nwere iwe n’afọ 2023 ka e mechara ntuliaka praịmarị nke pati ahụ na Kaduna.
Ndị bịaranụ bụ Gọvanọ steeti ahụ, Mal Nasiru El-Rufai, osote ya, Hadiza Balarabe, ndị isi ọchịchị na ndị isi pati ndị ọzọ.
Lukman dụrụ ndị otu pati ahụ iwe na-ewe na zone ka ha hụ na ha mekọrịtara ka ha gbanarị ihe mere na Zamfara steeti n’afọ 2019 ebe ọgbaghara n’ime pati mere ka pati mmegide, PDP merie na ntuliaka.
Ọ kọwara na, ndị na-anọghị na nzukọ ahụ nwetara ọkpụkpọ òkù n’oge mana o mesiri ike na a ga-agakwuru ha n’otu n’otu maka ime ka ha dịghachi ná mma.
“A ga-ahazi nzukọ ọzọ maka ndị na-anọghị ya iji dozie mkpesa ha wee hụ na ha na-arụ ọrụ ha iji hụ na pati ahụ nwetara mmeri.”
Leave a Reply