Take a fresh look at your lifestyle.

MuhammaduBuhari akpọkuola ndị isi ọdịda anyanwụ Afrịka ka ha mee ike ha niile iji hụ na e mere ntuliaka…

Timothy Choji, n' Abuja dere ya na bekee.

0 579

Onye isi ala Buhari na-enye ndị ndu ọdịda anyanwụ  Afrika ọrụ maka ntuli aka efu na nke ziri ezi.

Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari akpọkuola ndị isi ọdịda anyanwụ Afrịka ka ha mee ike ha niile iji hụ na e mere ntuli aka na mba ha n’ọnọdụ ntụkwasị obi, nnwere onwe, na nghọta.

Onyeisiala Buhari kpọrọ oku a na Monrovia dị na Laịberịa n’ozi obi ọma o zigara gọọmentị na ndị Laiberia ka o sonye na ndị isi ụwa ndị ọzọ n’ememe ncheta afọ 175th nke nnwere onwe nke mba ọdịda anyanwụ Afrika.

Dịka onye ndu Naijiria siri kwuo, ọchịchị onye kwuo uche ya na ezi ọchịchị ga-agbanyerịrị mgbọrọgwụ na kọntinent Afrika iji kwado udo, kwụsie ike na mmepe ebe ndị isi ga-agbarịrị mbọ ha abụọ iji hụ na ọchịchị onye kwuo uche ya agaghị agbanwe agbanwe.

“Ọ ga-amasị m iji ohere nke mmemme a leba anya n’okwu dị mkpa metụtara mba atọ na mpaghara ECOWAS; Laiberia, Naijiria, na Sierra Leone.

“Mba atọ a niile nwere ntuli aka mba na 2023. Na Naijiria, anyị na-arụ ọrụ iji nweta nhoputa ndi ochichi n’efu, nke ziri ezi, nke doro anya, nke kwesiri ntukwasi obi, na nnabata nke ntuli aka na nsonazụ ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *