Onye isi ala Muhammadu Buhari akpọọla ndị Naijiria ka ha tinye mmasị obodo ahụ karịa ọdịmma onwe onye ma “jiri okpukpere chi dị ka ihe mkpali maka ịhụnanya nke ọha mmadụ anyị.”
N’ozi ya Eid-el Kabir o degaara ndị Alakụba Naịjirịa na ụmụ amaala ndị ọzọ, Onyeisiala Buhari kwuru na “ọ bụrụ na anyị na-etinye nkuzi okpukperechi anyị n’ọrụ, a gaara ewepụ ọtụtụ ihe ọjọọ na-akpa obodo anyị nsogbu.”
Dị ka Onye isi ala si kwuo, “o kwesịghị iji okpukpe mee ihe dị ka akara njirimara nkịtị, kama dịka ihe mkpali maka imere obodo anyị na ụmụ mmadụ ihe ọma.”
Ọ kọwara na “ndị ahịa na-erigbu ndị mmadụ na ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ ji ntụkwasị obi ọha na-ezu ohi bụ ngosipụta nke agbahapụla ozizi okpukpe anyị.”
“A gaara edozila obodo anyị.”
Dị ka Onye isi ala si kwuo, “o kwesịghị iji okpukpe mee ihe dị ka akara njirimara nkịtị, kama dịka ihe mkpali maka imere obodo anyị na ụmụ mmadụ ihe ọma.”
Leave a Reply