Take a fresh look at your lifestyle.

Ọkụ ụlọ ọgwụ Senegal gburu ụmụaka ọhụrụ iri na otu

0 566

Nwa ọhụrụ di iri na otu anwụọla n’ọkụ gbara n’ụlọọgwụ dị na ọdịda anyanwụ obodo Senegal dị na Tivaouane, onyeisiala mba ahụ kwuru.

Onye isi ala Senegal Macky Sall kwuru na tweet “maka mgbu na mwute maka ọnwụ ụmụaka ọhụrụ 11 n’ ihe mberede ọkụ nke mere na ngalaba nwa ọhụrụ nke Mame Abdou Aziz Sy Dabakh Hospital na Tivaouane.”

Akụkọ mbụ na-egosi na ọ bụ ‘obere sekit’ kpatara ọkụ a dịka onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo si kwuo.

A zọpụtara ụmụ ọhụrụ atọ na ọkụ, onye isi obodo ahụ, Demba Diop Sy kwuru.

Ọkụ ahụ gbasara ngwa ngwa ma ndị ọrụ mberede ka nọ ebe ahụ, Maazị Sy kwukwara.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *