Take a fresh look at your lifestyle.

NSCDC nke Kaduna enwetala onyeisi ọhụrụ

0 564

Ụlọ ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps,Kaduna State Command anabatala onye Commandant ohuru bu, Idris Yahya Adah.

O weghara ọkwa dika onye jibu ọkwa Commandant nke Kaduna bụ, Dr. Godwin  Miebi lara ezumike-nka n’ọnwa Mee,afọ 2022.

Nkea dina akwụkwọ onye Corps’ Public Relations Officer bụ, DSC Habeeb Badamasi binyere aka na Kaduna.

Emume nnabata bụ nke wuru ewu,ebe nwamadi a kwara ndi ọrụ okwu ma kele onye Commandant General, Dr. Abubakar Audi maka ntukwasi obi onwere n’ebe ọnọ,ma kwe nkwa itinyesi uchu n’ọrụ ya na Steeti a.

Commandant Idris gara n’ihu yọọ ndi Steeti Kaduna state ka ha nyere ha site na izitere ha ozo ga enye aka maka ezi nchekwa na Steeti a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *