Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere m ji akwado onye Ukwu ịbụ Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 – Orji Uzor Kalu

0 601

Aka chiburu Steeti Abia ma bụrụkwa sịnetọ n’anọchite anya mpaghara Abia North bụ Orji Uzor Kalu ekwuola ihe mere o ji akwado onye ugwu ịbụ onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023.

Kalu kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV n’ụbọchị Mọnde abali iri isii nke ọnwa Mee, afọ 2022.

Ihe mere nkwado Kalu ji agbagwoju ndị mmadụ anya bụ na ọ na-abịa ugbua ọtụtụ na-akpọ oku na o ruuru ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ịhọpụta onyeisiala

Mana Kalu sị na o mere nke a maka na ndị pati ha si na mpaghara South West na South South achọghị ime ihe ha kwerikọtara ha nwere nke sị na a ga-ahapụrụ.

Ọ sị na ha nwere mkpebi a mgbe ha na-azọ ka e nye ndị si mpaghara Ndịda ohere ịbụ onyeisiala n’afọ 2023.

“Mgbe anyị na-azọ ka e nye ndị Ndịda ohere ịbụ onyeisiala Naịjirịa, anyị nwere nkwekọrịta na ọ ga-abụ onye si na Ọwụwa Anyanwụ”.

“Mana mgbe oge ruru, ụmụnne anyị ndị si mpaghara Ndịda ndị ọzọ (South West na South South) pụtaziri na-azọkwa ọkwa ha maara ruuru ndị Ọwụwa Anyanwụ.”

“Nke a mere m jiri sị kama ọ gaghị abụ onye Ọwụwa Anyanwụ na ọ ka mma ka onye si mpaghara Ugwu (North East) chịa maka na ha achịbeghi Naịjirịa mbụ.”

Ọ gara n’ihu kwuo na ihe ndị a na-eme ndị Igbo adịghị mma, na onye dị ka Obasanjo achịala afọ asatọ, Osinbajo chịa afọ asaa dịka osote onyeisiala, Goodluck Jonathan chịakwa dịka osote nakwa onyeisiala afọ asatọ.

“Ndị Igbo kwadochara ha niile n’oge ndị a mana ugbua o ruru oge ndị Igbo ịchị, onye ọbụla amakapụta sị na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala.”

Kalu sị na onye ọ na-akwado n’Ugwu ịbụ onyeisiala Naịjirịa bụ Ahmed Lawan bụ onyeisi ndị ụlọomeiwu ugbua.

Mgbe a jụrụ ya sị na ihe mere o ji akwado Lawan ọ bụ maka na ọ chọrọ ịbụ osote ya?

Kalu si na nke ahụ abụghị eziokwu na ọ gbaala akwụkwọ ịzọ ọkwa sịnetọ nke ugboro abụọ kama na ọ bụ maka na Lawan tozuru oke ịchị Naịjirịa.

Cheta na Kalu so na ndị si Ọwụwa Anyanwụ gosirila mmasị ha ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa mana ọ bịara dọlaa azụ sị na ọ naghịzi azọ.

Mgbe a jụrụ ihe mere, ọ sị na ọ bụ maka na ndị pati ya bụ All Progressive Congress (APC) achọghị inye naanị ndị Igbo ohere (zoning) ịzọ ọkwa a.

Kalu sị na ọ bụrụ na pati ya mechaa nye ndị Igbo ohere ahụ pụrụiche, na ọ ga-apụtakwa n’ọgbọ ịzọ ọkwa ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *