Take a fresh look at your lifestyle.

A zụtarala Goodluck Jonathan akwụkwọ ịzọ ọkwa onyeisiala na pati APC

0 741

Aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan ajụla ịnabata akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala APC nke otu ndị Ugwu zụtara ya n’Abuja na Mọnde.

Ọnụ na-ekwuru Jonathan bụ Ikechukwu Eze kwuru na ozi mgbasaozi o zitere ndi ntaakụkọ Igbo n’ụtụtụ Tuzde kwuru na onweghị onye Jonathan nyere ikike ịzụrụ ya akwụkwọ ngosi mmasị ọbụla.

N’ozi ahụ ọ sị, “Dkt. Goodluck Ebele Jonathan anụla na o nwere otu zụtara akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala nke otu ‘All Progressives Congress (the APC), n’aha ya.”

“Anyị na-ekwusi ya ike na Jonathan amaghị maka ya, nke ọ na-enye ikike ka e mee nke a.”

“Dịka ọ na-emetụ anyị n’obi etu ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akpọ oku ka Jonathan wepụta onwe ya ịzọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023, anyị na-ekwu na o kpebibeghị ikwete n’arịrịọ ha”.

N’agbanyeghị na ọ bụ onye People’s Democratic Party (PDP), akụkọ na-efegharị kemgbe na-ekwu na Jonathan chọrọ ịga APC maka ịzọ ọkwa onyeisiala.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ụmụ Naijiria mere ngagharị na-akpọ ya oku ka ọ pụta zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023.

Mana nke bụ eziokwu bụ na Jonathan ekwubeghị hohaa ma ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023.

Otu jikọrọ ndị na-achị ehi na ndị na-arịọ arịrịọ a kpọrọ ‘Almajiri’ zụọla aka chịbụrụ Naijiria bụ Goodluck Jonathan akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyesiiala nke otu APC ụbọchị Monde.

Ha kwuru na ndị otu ha rere ehi ha were tụkọta nde otu narị naira iji zụta akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ahụ.

Onyeisi otu ahụ bụ Ibrahim Abdullahi gwara ụlọntaakụkọ Punch na nke a bụ maka nkwadfo pụrụ iche Jonathan nyere ndị almajiri na ndị Fulani oge ọ nọ n’ọchịchị.ha dịka kwuo,

“Ana m anọchite otu abụọ; ndị na-achị ehi na ndị almajiri bụ ndị kpebiri ịzụtara aka chịbiri Naijiria bụ Goodluck Jonathan akwụkwọ a ka ọ laghachi bịa chịa alal a ji gaa n’ihu ọrụ ọma ọ malitere.”

“Ọ bụru na n’oge ọchịchị Goodluck Jonathan, ya bụ onyeisiala mbụ kemgbe nnwereonwe wepụtara atụmatụ ịhazigharị ndụ ndị Almajiri tinye ha n’usoro agụmakwụkwọ Naijiria.”

Cheta na nsonso a ụfọdụ ndị mmadụ mere ngagharị n’Abuja were kpoo oku ka Jonathan laghachị zọọ ọkwa onyeisiala.

Otu jịkọtara ndị ugwu agbatarala aka chiburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa onyeisala.

A mabeghị kpọkwem ma Jonathan o jirigo ọnụ ya wee kwupute na ọ na-abanye otu ndọrọndọrọ  APC.

Cheta na kepu kepu na-ekwubu na Jonathan na-achọ isi pati Peoples’ Democratic Pati banye pati n’ọchịchị ugbua bụ All Progressives Congress.

Ọ bụrụ na Jonathan nweta ọkwa onyeisiala ọzọ, o nwerike ịchị naanị afọ anọ dịka iwu Naịjirịa si kwu.

Ọ bụ n’afọ 2011, ka o nweteburu ọkwa onyeisiala dịka ọ chịtọpụchara ọkwa onyeisiala nke Musa Yar’Adua chịfọrọ mgbe Jonathan bụ osote ya.

Onyeisiala Buhari meriri Jonathan na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2015.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *