Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara ọdịmma mmadụ, njikwa ọdachi na mmepe mmekọrịta mmadụ na ibe ya, Sadiya Umar Farouq kwuru na ihe a na-esote bụ nyocha ikpeazụ nke ndị na-achọ akwụkwọ na agba nke mbu ,bụ ndị tozuru oke wee họrọ ka ha rite uru na obere mbinye ego sitere na N50,000 ruo N300,000.
“Ndị niile tozuru oke ga-enweta ọkwa nkwụghachi ụgwọ ha n’oge adịghị anya. Anyị chọrọ ichetara ndị niile na-erite uru na nke a bụ mbinye ego a na-akwụ na-enweghị ọmụrụ nwa. Ọ bụghị onyinye ma ọ bụ ifufe gọọmentị. Ọ bụ mbinye ego na-enweghị ọmụrụ nwa nke a ga-akwụghachi ya.
Minista Umar Farouq kwuwapụtakwara na Ministri ahụ na-eme atụmatụ iwepụta mmemme a na mba niile, mgbe nke ahụ gasịrị, mmemme ngụkọ iji weghara biodata nke ndị ga-erite uru, ga-ewere ọnọdụ.
GEEP 2.0 bụ atụmatụ mbinye ego nke Gọọmenti etiti mere iji nye ntinye ego na inye ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike ohere .,
Leave a Reply