Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Soludo sị na atụmatụ onye apụla ezi abịala na njedebe 

0 613

Na abali anọ nke ọnwa Epril ka aka n’achi steeti Anambra bụ ọkanmụta Chukwuma Soludo siri na atụmatụ ‘Sit at Home’bara n’isi njedebe.      Okwu banyere atụmatụ a dị ka a ga-asị na ọ bụzi ọkpụkpụ gbadoro mmadụ n’akpịrị, nke na-ekweghi olulo maọbụ ọgbụgbọ.

Ọtụtụ ndị mmadu bi n’mpaghara Ọwụwa Anyanwụ sị na o metụtala akụnụba ha ọkachasị ndị na-akpata ihe ha na-eri kwa ụbọchị.

Ebe ndị ọzọ na-ekwu ka a gaa n’ihu na-eme ya, ọkachasị ndị bi n’ofesi, na ọ bụ maka ịchụta nnwereonwe Biafra nakwa ịtọhapụ Mazi Nnamdị Kanu.

Mana akụkọ sị na otu ihe mere ụfọdụ ndị bi n’ofesi ji akwado ‘sit-at-home’ bụ maka uru ha nwereike irite na ya, otu n’ime ha bụ inweta ‘asylum’.

Otu onye bi n’ofesi na-achọghị ka a kpọo aha ya gwara ndi nta akụkọ Igbo na o ma ihe ruru mmadụ atọ ji ọnọdụ ala Igbo dị ugbua nwete ‘asylum’ na mba ofesi.

Mgbe otu na-achọ mnwereonwe Biafra site na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) sị na ha akagbuola atụmatụ onye apụla ezi kwa Mọnde ọbụla, ụfọdụ ndị otu ha gbarụrụ ihu maka mkpebi ahụ.

Ọtụtụ n’ime ha na-agbasa ozi na soshal midia na-akpọ oku ka ndị bi n’Ọwụwa Anyanwụ hapụ ige ntị n’iwu ọhụrụ ahụ.

Ha gara n’ihu kwuo na onye ọbụla a hụrụ n’ezi kwa Mọnde ọbụla ga-eji eze kpee ekwere, nke a butere ụjọ jiri dị na mpaghara ahụ ugbua.

Mana nchọpụta gosiri na ọtụtụ n’ime ndị na-agbasa ozi a bicha na mba ofesi, nọrọ ebe ahụ na-akwado ‘sit-at-home’ n’Ọwụwa Anyanwụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *