Take a fresh look at your lifestyle.

Ka Sinetọ Abdullahi Adamu,siri buru onyeisi ọhụrụ pati APC

0 393

Enweghi onye mara ya aka dịka a họpụtara ya na nzukọ ahụ e mere n’Abuja ruo isi ụtụtụ ubochi Sọnde.

Dịka ntuliaka 2023 na-abịa okwu ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n’ọnụ bụ echichi ima ma APC a ka ga-azọta ọchịọchị dịka onyeisala Muhammdu Buhari chịrịla afọ asatọ n’okpuru pati a.

Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) akpọpụtala ụbọchị ndị a ga-eme ntuliaka nke 2023.

Ka ha si dee, ntuliaka maka onyeisiala nakwa nke ndị ụlọomeiwu ga-abụ n’ụbọchị iri abụọ na ise  nke ọnwa Febụwarị 2023

Ebe ntuliaka maka ndị gọvanọ nakwa ndị ụlọomeiwu nta ga-abụ n’ụbọchị iri na otu nke ọnwa Maachị 2023.

N’ebe ngwụcha ọnwa Febụwarị 2022., onyeisiala Muhammadu Buhari mechara binye aka n’iwu ntuliaka ọhụrụ na Naịjirịa akpọrọ ‘Electoral Act Amendment Bill 2021’ nke ndị ụlọomeiwu jịkọrọ aka ọnụ wetere ya.

Iwu ọhụrụ ga-emetụta etu e si eme ntuliaka na Naịjirịa.

Ọtụtụ ọgbaghara adapụtala maka ọchịchị APC nke mere ndị mmadụ ji chịrị obi n’aka banyere ọgbakọ.

Onyeisiala Buhair agbala mbọ n’ikpezi esemokwu na-arị ibe ya elu na pati APC.

N’ọgbakọ ya na ụfọdụ ndị APC e mere n’ụbọchị iri na abụọ na atọ nke ọnwa Maachị, o kwuru:

O gara n’ihu kwuo: “Sọsọ ihe nọ n’uche anyị mgbe ahụ bụ atụmatụ mgbapụta nakwa atụmatụ ga-enyere Naịjirịa aka”

Buhari gara n’ihu kpọkọọ ndị hibere pati ahụ na ndị tụrụ ntụala ya bụ pati n’ọgbakọ ime ụlọ ha mere n’abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Maachị.

Etu esemokwu so ọgbakọ ‘National Convention’ a si malite

Tupu ụbọchị ọgbakọ a e ruo, ọtụtụ esemokwu nakwa ọgbaghara adapụtala na pati APC ọkachasị n’isi ụlọ.ọrụ ha n’Abuja.

N’abalị asaa nke ọnwa Maachị 2022 ndị uweojii wụchịrị n’ụzọ niile esi abanye isi ụlọọrụ pati a nke gbochiri ndị mmadụ ibanye.

Ka o si mee, gọvanọ Niger steeti bụ Abubakar Bello malitere ọrụ dịka onyeisi oche nke nwa mgbe nta kọmịtịị na-elekọta ọgbakọ pati a akpọrọ ‘Caretaker Extraordinary Convention Planning Committee’

Ihe a bụ ọkwa oche Mai Bala Buni bụ Gọvanọ Yobe steeti nọbụ na ya.

Ọtụtụ ndị isi pati a gbakọrọ n’isi ụlọọrụ nọ n’Abuja mgbe okwu ọchịchị gọvanọ Bello nke ọhụrụ a pụtara ihe.

Mgbakọ ha bụ maka nwee mkparịtaụka n’isi ọchịchị ya.

N’izu so ya, onyeisala Muhammdu Buhari zutere Gọvanọ Mai Mala Buni na London ma gwaa ya kọ ọ were oche ọchịchị dịka onyeisi oche Caretaker/Extraordinary Convention Planning Committee.

Ihe a mere n’ụbọchị iri na ise nke ọnwa Maachị.

Buhari zigara onyeisi oche otu gọvanọ ndị APC bụ Atiku Bagugu na gwaa ya ka ọ kwado Buni ma hụ na ọ malitere ọrụ ya ozugbo ozugbo.

N’izu so ya ụlọikpe mechara nye ohere ka APC nwee ike ime ya bụ ọgbakọ n’ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị agbanyeghị na ha eyierịala ya ihe ruru ugboro anọ maka okwu ọchịchị ime ụlọ ha.

Nyigharịa emela ugboro ugboro kemgba ọnwa Nọvemba 2021 ruo Maachị 2022.

Akwụkwọ ozi APC kwuru na ọ bụ maka nghọtaghe dị n’akụkụ iwu ntuliaka ọhụrụ a Onyeisiala binyere aka bụ ihe mere ha ji yigharịa ọgbakọ ha ruo ọnwa Maachị.

Marakwa na otu n’ime ihe dị na iwu a bụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n’oche ọchịchị agaghị eso mee ntuliaka ime ụlọ nke pati ha.

N’izu a, onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Ahmad Lawan kwuru na APC ga-ebịpụta ndị aha ndị ga-anọte ha na ọchịchị ha kpọrọ ‘unity list’ n’ụbọchị Fraịde.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *