Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe nne na-eme n’ọmụgwọ.

0 718

  • Nne ga na-enye nwa ya nwaanyị ihe ga-eme ka mmiri ara ya gbaa ọfụma
  • Nne ga na-esiri ya nri ndị ga-eme ka ahụ ya gbakee ọfụma
  • Nne ga na-ama ya mmiri ọkụ n’afọ na ebe ndị ọzọ ọ chọrọ, ma tekwaa ya ihe ga-ekpo ya ahụ ọkụ (robb, aboniki)
  • Nne ga na-enye nwata ọhụrụ nri, saa akwa ya ma saa ya ahụ
  • Ọ ga-adọtịkwa nwa ọhụrụ ahụ, ma hịa ya aka n’ahụ ọfụma
  • Ọ ga na-ahụ na nwa ya nọ ala n’elu bọketị awụnyere mmiri ọkụ na nnu na ọgwụ eji achụ nje, nke ga-eme ka ọbara ọjọọ nwee ike gbapụta
  • Ọ ga na-ekekpa ya afọ ka o nwee ike taa ma hara etu ọhabu tupu ọ dị ime
  • Nne ga na-agba nwa ya nwaanyị ume maka na ya na onwe ya anọọla n’ọnọdụ ahụ mbụ
  • Ọ ga na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ dị n’ụlọ dịka ihazi ụlọ na isi nri ezinaụlọ na-eri

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *