Take a fresh look at your lifestyle.

Ramadan: Osote onye isi ndị omebe iwu Sineti gwara ndị Alakụba ka kpe ekpere maka Naijiria

0 344

Osote onye isi ndị omebe iwu Sineti, ọgbakọ omebe iwu mba, Sinetọ Lola Ashiru akpọkuola ndị Alakụba ọkachasị ndị ụkọchukwu ka ha kpesie ekpere ike maka ọganiru obodo.

Sinetọ Ashiru kpọkukwara ndị Alakụba niile ka ha gosi ịhụnanya na nghọta n’ebe ndị okpukpere chi niile nọ ka ha na-eme akụkụ a dị mkpa nke okwukwe Islam.

Sinetọ Ashiru kwuputara echiche ndị a n’ozi Ramadan ya.

Ọ gbara ndị Alakụba ume ka ha hụ ọnwa nke Ramadan ka oge nsọ, ịhụnanya, na ịdị n’otu nke Allah pụrụ ime ihe nile.

“Dịka anyị na-eme Ramadan, ka anyị chetakwa ịbụ ndị na-elekọta ụmụnna anyị ma na-enyere ndị nọ ná mkpa aka n’ụdị ọ bụla dị mma n’ihu, n’oge na mgbe oge Ramadan na ka anyị na-abịaru nso na onye kere anyị.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *